3 Mgbe Joshua guzo nʼihu mmụọ ozi ahụ, uwe ya ruru unyi. 4 Mmụọ ozi ahụ gwara ndị ahụ guzo ya nʼihu, “Yipụnụ ya uwe a ruru unyi.”
5 Ekwuru m, “Ka ha were ezi akwa okike dị ọcha kee ya nʼisi.” Ya mere ha weere akwa okike dị ọcha kee ya nʼisi, yikwasịkwa ya uwe ọhụrụ. Mmụọ ozi Onyenwe anyị guzokwa nʼebe ahụ.
6 Mgbe ahụ, mmụọ ozi nke Onyenwe anyị nyere Joshua ndụmọdụ sị, 7 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Ọ bụrụ na i jee ije nʼụzọ m niile, ọ bụrụkwa na i debe ihe niile m nyere gị nʼiwu, ị ga-abụ onyeisi ezinaụlọ m, ị ga-elekọta ụlọnsọ m anya, aga m enyekwa gị ọnọdụ nʼetiti ndị a niile guzo nʼebe a.
8 “ ‘Gee m ntị, gị Joshua, onyeisi nchụaja na unu ndị nchụaja ndị ọzọ nọ nʼihu gị, ndị bụ ihe ngosi banyere ihe ọma niile nke gaje ịbịa. Agaje m ịkpọta nwaodibo m, onye bụ Ngalaba ahụ. 9 Lee, nkume nke m guzobere nʼihu Joshua. Nkume ahụ nwere akụkụ[a] asaa nʼahụ ya, aga m egbunye akara dee ihe nʼelu ya. Aga m ewezugakwa mmehie nke ala a nʼotu ụbọchị.’ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
10 “ ‘Nʼụbọchị ahụ, onye ọbụla nʼime unu ga-akpọbata mmadụ ibe ya, ka ọ bịa soro ya nọdụ nʼokpuru osisi vaịnị ya, na nʼokpuru osisi fiig ya.’ Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.”
<- Zekaraya 2Zekaraya 4 ->- a Maọbụ, ihu asaa