3 Nʼihi na mbụ, anyị onwe anyị bụ ndị nzuzu, ndị na-enupu isi, na ndị na-enweghị uche. Anyị bụ ohu agụụ ihe ọjọọ, na ihe ụtọ dị iche iche. Anyị biri ndụ obi ọjọọ na ekworo, na ịkpọrịta onwe anyị asị. 4 Ma mgbe obiọma na ịhụnanya Chineke Onye nzọpụta anyị pụtara ihe, 5 ọ zọpụtara anyị, ma ọ bụghị nʼihi ezi ihe ndị anyị mere, kama ọ bụ site nʼebere ya. Ọ zọpụtara anyị site na nsacha nke ịmụ ọzọ na nnwogharị nke Mmụọ Nsọ, 6 onye ọ wụsara anyị nʼuju site nʼOnye nzọpụta anyị bụ Jisọs Kraịst, 7 ka ọ bụrụ na ebe e sitere nʼamara gụọ anyị dịka ndị ezi omume, anyị ga-abụ ndị nketa, ndị nwere olileanya ndụ ebighị ebi. 8 Okwu a kwesiri ntụkwasị obi, ọ ga-amasị m ma i kwusie ihe ndị a ike, ka ndị kweere na Chineke, lezie anya nʼịrụ ezi ọrụ. Ihe ndị a dị mma na-abakwara mmadụ uru.
9 Ma zere ịrụ ụka nzuzu na ịgụ agbụrụ ọmụmụ, esemokwu niile, na ọgụ niile ndị mmadụ na-alụ banyere iwu. Ihe ndị a niile abaghị uru ọbụla, ha bụ ihe efu. 10 Gbasara onye na-akpa oke, ị dụchaa ya ọdụ ihe dịka otu ugboro maọbụ abụọ, leghara ya anya. 11 Ebe ị ma na onye dị otu a bụ onye ndahie na onye ajọọ omume, o jirila aka ya maa onwe ya ikpe.