2 Rut onye Moab, gwara Naomi okwu sị ya, “Kwere ka m gaa nʼubi ebe a na-aghọ ọka, ka m lee ma m ga-achọta ihuọma nʼihu ndị na-aghọ ọka, ndị ga-ekwere ka m tụtụkọta ọka[a] ndị ha hapụrụ.”
4 Nʼoge ahụ, Boaz nʼonwe ya si na Betlehem bịarute nʼubi ahụ, kelee ndị ahụ na-aghọ mkpụrụ nʼubi sị ha, “Onyenwe anyị nọnyere unu.”
5 Mgbe Boaz hụrụ Rut, ọ jụrụ onyeisi ndị ọrụ ubi ya sị, “Onye ka nwanyị a bụ?”
6 Onye nlekọta ọrụ ubi ahụ zaghachiri, “Ọ bụ onye Moab ahụ so Naomi lọta. 7 Ọ sịrị, ‘Biko kwere ka m soro ndị ọrụ nʼazụ tụtụkọtaa ukwu ọka ha hapụrụ.’ Kemgbe ụtụtụ ọ bịara, ọ kwụsịbeghị ọrụ ya karịakwa naanị nwa mgbe nta o zuru ike nʼokpuru ndo.”
8 Ya mere, Boaz gwara Rut okwu sị ya, “Nwa m nwanyị, gee m ntị. Agakwala ịtụtụ ọka nʼubi ọzọ, esitekwala nʼebe a pụọ. Soro ụmụ agbọghọ na-ejere m ozi nọdụ nʼebe a. 9 Lezie anya nʼubi ebe ndị ikom na-ewe ihe ubi, ma soro ụmụ agbọghọ ndị a. Enyela m ndị ikom ndị a iwu ka ha ghara ịmetụ gị aka. Mgbe ọbụla agụụ mmiri gụrụ gị, gaa nʼite mmiri ndị ahụ ndị ikom gbanyere mmiri kuru mmiri ṅụọ.”
10 Mgbe Boaz na-agwa ya okwu, Rut hulatara isi ya ala. Emesịa o kwuru sị, “Gịnị mere m ji chọta ụdị amara dị otu a nʼebe ị nọ, na ị hụtara m, ebe ị maara na m bụ naanị onye mba ọzọ?”
11 Boaz zara sị ya, “Anụla m ihe niile i meere nne di gị site nʼoge di gị nwụrụ, na otu i si hapụ nne gị na nna gị, na ala ebe amụrụ gị, bịa nʼebe a ibi nʼetiti ndị ị na-amaghị na mbụ. 12 Ka Onyenwe anyị kwụghachi gị ụgwọ ihe ọma ndị a i mere. Ka Onyenwe anyị onye bụ Chineke Izrel, onye ị gbabara nʼokpuru nku ya izere ndụ kwụghachi gị nkwụghachi dị ukwu nʼihi ezi ọrụ gị niile.”
13 Rut zara sị ya, “Ka m gaa nʼihu na-achọta amara nʼebe ị nọ, onyenwe m. Nʼihi na ị kasịela m obi, gwakwa m, odibo nwanyị gị, okwu dị nro. Ọ bụ ezie na m abụghị otu nʼime ndị odibo nwanyị gị.”
14 Mgbe oge iri nri ruru, Boaz sịrị ya, “Bịa nso nʼebe a, were ụfọdụ nri rie, sunyekwa achịcha gị nʼime mmanya viniga.”[b]
17 Ya mere, Rut tụtụrụ ọka nʼubi ahụ ruo oge anyasị. Mgbe ọ fuchasịrị ọka balị niile ọ tụtụtara, o nwetara ihe nwere ike iru otu bushel. 18 O buuru ya baa nʼime obodo, bunye ya nne di ya, nyekwa ya nri o rifọrọ mgbe o rijuchara afọ.
19 Nne di ya jụrụ ya, “Ebee ka ị tụtụrụ ọka taa? Ebee ka ị rụrụ ọrụ? Ka nwoke ahụ hụtara gị bụrụ onye a gọziri agọzi.”
20 Mgbe ahụ Naomi zara nwunye nwa ya sị, “Onye Onyenwe anyị gọziri ka ọ bụ, onye na-ahapụbeghị igosi ebere ya nye ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ. Nwoke a bụ otu nʼime ndị agbụrụ anyị, otu onye nʼime ndị onye mgbapụta anyị.”[c]
21 Mgbe ahụ Rut, onye Moab sịrị, “Ihe ọ sịkwara m bụ, ‘Nọnyere ndị ọrụ m tutu ruo mgbe ha ghọchara ọka niile dị nʼubi m.’ ”
22 Naomi sịrị Rut, nwunye nwa ya, “Nwa m nwanyị, ọ kaara gị mma ime dịka o kwuru. Soro ụmụ agbọghọ nọ nʼubi ya nʼazụ tụtụọ ọka ị na-atụtụ, nʼihi na nʼubi onye ọzọ, e nwere ike imerụ gị ahụ.”
23 Ya mere, Rut sogidere ụmụ agbọghọ Boaz na-atụtụ ọka, tutu ruo ọgwụgwụ ịghọ ọka balị na wiiti. Ya na nne di ya bigidekwara.
<- Rut 1Rut 3 ->- a Ị tụtụkọta ọka ndị a hapụrụ mgbe a na-ewe ihe ubi, bụ oke ndị inyom di ha nwụrụ anwụ, na ụmụ mgbei na ndị ọbịa. Lev 19:9; Dit 24:19
- b Ọ bụ mmanya gbara ụka a wụnyere mmanụ ntakịrị, ka e ji emepụta mmanya viniga.
- c Onye mgbapụta anyị Onye dị otu a, aghaghị ịbụ onye metụtara nwoke ahụ nwụrụ anwụ. O nwere ike bụrụ nwanne ya maọbụ nwanna ya. Ọ bụ ya ka ọ dịrị dịka iwu ahụ si dị, inwetaghachi maọbụ zụghachite ala niile nke onye ahụ nwụrụ anwụ. Iwu ahụ bụ, na onye mgbapụta a dị nso, ga-alụ nwunye nwanne maọbụ nwanna ya ahụ nwụrụ anwụ, ma ọ bụrụ na ọ mụtaghị nwa. Dit 25:5-10