Link to home pageLanguagesLink to all Bible versions on this site
Abụ Ọma 98
Abụ Ọma.
Toonu Onyenwe anyị onye ezi omume
1 Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ,[a]
nʼihi na ọ rụọla ọtụtụ ọrụ dị ebube;
aka nri ya na aka nsọ ya
arụpụtarala ya nzọpụta.
2 Onyenwe anyị emeela ka a mata nzọpụta ya
o kpugheela ezi omume ya nye mba niile.
3 O chetala ịhụnanya ya
na ikwesi ntụkwasị obi ya nʼebe ụlọ Izrel dị;
nsọtụ nke ụwa niile ahụla
nzọpụta Chineke anyị.
 
4 Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile
jirinụ iti egwu tiwaa mkpu abụ ọṅụ;
5 werenụ ụbọ akwara bụkuo Onyenwe anyị abụ,
e, were ụbọ akwara na olu abụ ọma,
6 jirinụ opi na opi ike,
tisie mkpu ọṅụ ike nʼihu Onyenwe anyị, Onye bụ Eze.
 
7 Ka oke osimiri niile gbọọ ụja, ya na ihe niile dị nʼime ya,
ụwa na ndị niile bi nʼime ya.
8 Ka osimiri na iyi niile kụọ aka ha,
ka ugwu niile bụkuokwa ya abụ nʼihi ọṅụ;
9 ka ha bụọ abụ nʼihu Onyenwe anyị,
nʼihi na ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe.
Ọ ga-eji ezi omume kpee ụwa ikpe.
Ọ ga-eji ikpe ziri ezi kpee ndị niile ikpe.

<- Abụ Ọma 97Abụ Ọma 99 ->