Link to home pageLanguagesLink to all Bible versions on this site
Abụ Ọma 76
Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Nke eji ụbọ akwara akpọ. Abụ Ọma Asaf. Otu Abụ.
Ike mmeri nke Chineke
1 A maara Chineke nʼobodo Juda;
aha ya dị ukwuu nʼobodo Izrel.
2 Ụlọ ikwu ya dị na Salem,
ebe obibi ya dị na Zayọn
3 Ebe ahụ ka o tijisịrị àkụ niile na-egbu amụma,
na ọta niile, na mma agha niile, na ngwa agha niile.
Sela
 
4 Ị jupụtara nʼìhè,
ị dị oke ebube karịa ọtụtụ ugwu nke anụmanụ jupụtara.
5 A pụnarịla ndị nwere obi ike ihe ha,
ha na-arahụkwa ụra ikpeazụ ha;
o nweghị otu onye nʼime ndị dike nʼagha ndị a
pụrụ iweli aka ya abụọ elu.
6 Nʼihi ịba mba gị, O Chineke nke Jekọb,
ịnyịnya na ụgbọ agha na-anọ juu.[a]
 
7 Ọ bụ naanị gị ka e kwesiri ịtụ egwu.
Onye pụrụ iguzo nʼihu gị mgbe i na-ewe iwe?
8 I sitere nʼeluigwe mee ka a nụ olu ikpe ikpe gị.
Ụwa tụkwara egwu, dere duu,
9 mgbe gị, O Chineke, biliri ikpe ikpe,
ịzọpụta ndị niile a na-akpagbu nʼala a.
Sela
10 Nʼezie, oke iwe gị megide ụmụ mmadụ na-ewetara gị otuto,[b]
ndị fọdụrụ mgbe oke iwe gị gabigasịrị, na-anọ juu.
 
11 Kwenụ Onyenwe anyị Chineke nkwa ma mezuokwa ha;
ka ndị ala niile bụ agbataobi unu
wetara onye ahụ e kwesiri ịtụ egwu onyinye dị iche iche.
12 Ọ na-eweda ndị na-achị achị nʼala;
ndị eze niile nke ụwa na-atụ ya egwu.

<- Abụ Ọma 75Abụ Ọma 77 ->