Link to home pageLanguagesLink to all Bible versions on this site
Abụ Ọma 61
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid nke eji ụbọ akwara akpọ.
Ekpere nke onye nọ na nsogbu
1 Nụrụ akwa m, O Chineke,
gee ntị nʼekpere m.
 
2 Ana m akpọku gị site na nsọtụ nke ụwa,
ana m akpọku gị mgbe obi m na-ada mba;
duru m gaa nʼoke nkume ahụ nke karịrị m elu.
3 Nʼihi na ị bụrịị ebe mgbaba m,
na ụlọ ahụ dịkarịrị elu, sie ike imegide onye iro ahụ.[a]
 
4 Ọ na-agụ m ibi nʼụlọ ikwu gị ruo mgbe ebighị ebi,
ka m gbaba, zere ndụ nʼokpuru nku gị abụọ.
Sela
5 Nʼihi na gị onwe gị, Chineke, anụla nkwa niile m kwere;
i nyela m ihe nketa nke ndị na-atụ egwu aha gị.
 
6 Tụkwasị ọtụtụ ụbọchị na ndụ eze,
mee ka afọ ya ruo ọtụtụ ọgbọ.
7 Kwere ka ọ nọrọ nʼocheeze nʼihu Chineke ruo mgbe ebighị ebi;
zidata ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị, ka ha na-echezikwa ya.
 
8 Mgbe ahụ, aga m abụ abụ otuto nye aha gị, ruo mgbe ebighị ebi.
Aga m emezukwa nkwa m kwere gị ụbọchị niile.

<- Abụ Ọma 60Abụ Ọma 62 ->