Link to home pageLanguagesLink to all Bible versions on this site
Abụ Ọma 57
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke olu abụ “E bibikwala” Devid. Abụ miktam. Mgbe ọ gbapụrụ ga biri nʼime ọgba nkume nʼihi Sọl.
Ntụkwasị obi nʼime Chineke
1 Meere m ebere, O Chineke, meere m ebere,
nʼihi na ọ bụ gị ka mkpụrụobi m ji mere ebe mgbaba.
Ọ bụ na ndo nke nku gị abụọ ka m ga-agbaba
tutuu ihe mbibi ndị a agafesịa.
 
2 Aga m akpọku Chineke nke kachasị ihe niile elu,
Chineke na-emezuru m ihe niile na-akpa m mkpa.
3 Ọ na-esite nʼeluigwe zidata inyeaka ma zọpụta m
na-abara ndị ahụ ji ike na-achụ m mba;
Sela
Chineke na-ezite ịhụnanya ya na ikwesi ntụkwasị obi ya.
 
4 Anọ m nʼetiti ọtụtụ ọdụm;
amanyere m ka m dina nʼetiti ajọ anụ ọhịa,
ụmụ mmadụ ndị eze ha dị nkọ dịka àkụ na ùbe,
ire ha dịkwa nkọ dịka mma agha.
 
5 O Chineke, ka e bulie gị elu karịa eluigwe niile;
ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.
 
6 Ha gbasaara ụkwụ m ụgbụ,
ihe mgbu nyịturu m.
Ha egwuola olulu nʼụzọ m si agafe,
ma ha onwe ha adabala nʼime ya.
Sela
 
7 Obi m dị njikere, o Chineke,
obi m dị njikere sikwaa ike;
aga m abụ abụ, kụkwaa egwu.
8 Teta nʼụra mkpụrụobi m!
Teta, ụbọ akwara na une!
Aga m akpọte chi ọbụbọ.
 
9 O Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile;
aga m abụ abụ banyere gị nʼetiti ndị niile dị iche iche.
10 Nʼihi na ịhụnanya gị dị ukwuu na-eru na mbara eluigwe;
ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa mbara eluigwe.
 
11 O Chineke, ka e bulie gị elu karịa eluigwe;
ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.

<- Abụ Ọma 56Abụ Ọma 58 ->