Link to home pageLanguagesLink to all Bible versions on this site
Abụ Ọma 36
Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid, bụ ohu Onyenwe anyị.
Ajọ omume mmadụ na ịdị mma Chineke
1 E nwere m ozi dị nʼime obi nke sitere nʼaka Chineke
banyere ndụ mmehie nke ndị na-eme ajọ ihe:[a]
Ọ dịghị ịtụ egwu Chineke
dị nʼanya ha.
 
2 Nʼihi ha na-agwarịta onwe ha okwu ire ụtọ nʼanya ha onwe ha,
na o nweghị ụzọ a ga-esi nwe ike ịchọpụta mmehie ha maọbụ kpọọ ya asị.
3 Okwu ọnụ ha niile bụ ihe ọjọọ na aghụghọ;
ha adịghị eji uche eme ihe maọbụ mee ihe dị mma.
4 Ọ bụladị mgbe ha nọ nʼelu ihe ndina ha, ha na-eche echiche ajọ ihe;
ha enyefeela onwe ha nʼaka ndụ ajọ omume,
ha adịghị ajụkwa ihe na-ezighị ezi.
 
5 O Onyenwe anyị, ịhụnanya gị na-eru mbara eluigwe,
ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa igwe ojii nke eluigwe.
6 Ezi omume gị dịka ugwu dị ukwuu,
ikpe ikpe ziri ezi gị dịka omimi nke oke osimiri.
O Onyenwe anyị, ị na-echebe ụmụ mmadụ na anụmanụ.
7 Lee ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ si dị oke ọnụahịa, O Chineke!
Ụmụ mmadụ na-agbaba nʼokpuru ndo nke nku gị abụọ.
8 Ha na-eri oriri site nʼịba ụba nke ụlọakụ gị;
Ị na-enyekwa ha mmiri site nʼiyi nke obi ụtọ gị.
9 Nʼihi na mmiri na-enye ndụ dị na gị;
ọ bụkwa nʼìhè gị ka anyị na-ahụ ìhè.
 
10 Mee ka ịhụnanya gị na-adịgidere ndị maara gị,
ka ezi omume gị na-adịgidekwara ndị ziri ezi nʼobi.
11 Ekwela ka ndị mpako a zọọ m ụkwụ nʼisi,
ekwekwala ka aka ndị ajọ omume nupu m nʼebe m guzo.
12 Lee ka ndị na-eme ajọ ihe si daa nʼala,
a kwatuola ha nʼala, ha apụghịkwa ibilite ọzọ.

<- Abụ Ọma 35Abụ Ọma 37 ->