Abụ Ọma 29
Abụ Ọma Devid.
Olu Onyenwe anyị
1 Toonu Onyenwe anyị, unu ndị bi nʼeluigwe,
nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ nʼihi ebube na ike ya.
2 Nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ kwesiri aha ya;
kpọọ isiala nye Onyenwe anyị nʼebube nke ịdị nsọ ya.
3 Olu Onyenwe anyị na-ada nʼelu osimiri;
olu Chineke dị ebube na-ada ike ike,
olu Onyenwe anyị na-ada dịka egbe eluigwe*Job 37:4-5; Abụ 18:13 nʼelu oke osimiri.
4 Olu Onyenwe anyị dị ike,
olu Onyenwe anyị jupụtakwara nʼebube.
5 Olu Onyenwe anyị na-etiwa osisi ukwu sida;
Onyenwe anyị na-etiwasị osisi ukwu sida nke Lebanọn.
6 Ọ na-eme ka Lebanọn wulie elu dịka nwa ehi,
ọ na-eme ka Siriọn†Nke a bụ aha ndị Fonikisi bi na mpaghara ugwu Hemon na-akpọ ugwu ahụ. Hemon dị nʼoke ala nkwa ahụ nʼebe ugwu. Dit 3:9; Abụ 42:6 wulie elu dịka nwa atụ.
7 Olu Onyenwe anyị na-agba dịka egbe eluigwe
mgbe amụma na-egbu.
8 Olu Onyenwe anyị na-eme ka ọzara maa jijiji;
Onyenwe anyị na-eme ka ọzara Kadesh maa jijiji.
9 Olu Onyenwe anyị na-eme ka osisi ook gbagọọ‡Ime na-eme nne ele
na-agbuchapụkwa akwụkwọ niile nke oke ọhịa.
Nʼime ụlọnsọ ukwuu ya mmadụ niile na-eti, “Ebube!”
10 Onyenwe anyị nọ nʼocheeze ya nʼelu uju mmiri;
Onyenwe anyị na-achị dịka eze ruo mgbe ebighị ebi.
11 Onyenwe anyị na-enye ndị ya ike,
ọ ga-ejikwa udo gọzie ndị ya.
<- Abụ Ọma 28Abụ Ọma 30 ->
*Abụ Ọma 29:3 Job 37:4-5; Abụ 18:13
†Abụ Ọma 29:6 Nke a bụ aha ndị Fonikisi bi na mpaghara ugwu Hemon na-akpọ ugwu ahụ. Hemon dị nʼoke ala nkwa ahụ nʼebe ugwu. Dit 3:9; Abụ 42:6
‡Abụ Ọma 29:9 Ime na-eme nne ele