Link to home pageLanguagesLink to all Bible versions on this site
Abụ Ọma 149
Abụ otuto
1 Toonu Onyenwe anyị!
 
Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ.
Bụọnụ abụ ito ya nʼetiti ndị nsọ ya.
 
2 Ka Izrel ṅụrịa ọṅụ nʼime onye kere ha;
ka ndị bi na Zayọn nwee obi ụtọ nʼime Eze*Nkp 8:23; Zek 9:9; Mat 21:5 ha.
3 Ka ha jiri ite egwu too aha ya
ka ha jiri ọyọ na ụbọ akwara kpọọrọ ya egwu.
4 Nʼihi na ihe banyere ndị ya na-atọ Onyenwe anyị ụtọ.
Ọ na-eji nzọpụtaAbụ 132:16; Aịz 61:10 kpukwasị ndị dị umeala nʼobi nʼisi dịka okpueze.
5 Ka ndị nsọ ṅụrịa ọṅụ nʼime nsọpụrụ a,
bụkwaa abụ nʼihi ọṅụ nʼelu ihe ndina ha.
 
6 Ka otuto Chineke dịrị nʼọnụ ha,
ka mma agha ihu abụọHib 4:12; Mkp 1:16 dịrịkwa nʼaka ha,
7 iji bọọrọ mba niile ọbọ
taakwa ndị niile dị iche iche ahụhụ,
8 iji mkpọrọ igwe kee ndị eze ha
na ndị ha a na-asọpụrụ agbụ igwe,
9 imezu ihe ahụ e kpebiri, depụtakwa megide ha.
Nke a bụ nsọpụrụ dịrị ndị nsọ ya.
 
Toonu Onyenwe anyị.

<- Abụ Ọma 148Abụ Ọma 150 ->