Link to home pageLanguagesLink to all Bible versions on this site
Abụ Ọma 137
Abụ ndị a dọtara nʼagha
1 Nʼakụkụ iyi niile Babilọn ka anyị nọdụrụ ala kwaa akwa
mgbe anyị chetara Zayọn.
2 Ọ bụ nʼosisi pọpla
ka anyị kokwasịrị ụbọ akwara anyị niile.
3 Nʼebe ahụ ka ndị dọtara anyị nʼagha gwara anyị ka anyị bụọrọ ha abụ,
ndị na-emekpa anyị ahụ rịọrọ anyị ka anyị bụọrọ ha abụ ọṅụ;
ha kwuru sị, “Bụọrọnụ anyị otu abụ nʼime abụ Zayọn!”
 
4 Ma, olee otu anyị ga-esi bụọ abụ Onyenwe anyị
ebe anyị nọ nʼala ọzọ?
5 Ọ bụrụ na m echezọọ gị, Jerusalem,
ka aka nri m chefuo ǹka ya.
6 Ọ bụrụ na m echezọọ gị,
ọ bụrụkwa na m akwụsị iche echiche
banyere Jerusalem, oke ọṅụ m,
ka ire m rapara nʼokpo ọnụ m.
 
7 Cheta, o Onyenwe anyị, ihe ndị Edọm mere
nʼụbọchị ahụ a dọtara Jerusalem nʼagha.[a]
“Tikpọsịa ya,” ka ha tiri,
“Tikpọsịa ya ruo na ntọala ya niile!”
8 Gị ada Babilọn, onye a ghaghị ịla nʼiyi,
ọṅụ ga-abụ nke onye ahụ ga-akwụghachi gị ụgwọ ọrụ ruru gị
nʼihi ihe i mere anyị,
9 onye ahụ ga-achịrị ụmụ gị ndị na-aṅụ ara
tụpịa ha nʼelu nkume.[b]

<- Abụ Ọma 136Abụ Ọma 138 ->