Link to home pageLanguagesLink to all Bible versions on this site
Abụ Ọma 114
Abụ ncheta ngabiga
1 Mgbe ụmụ Izrel si nʼala Ijipt pụta,
mgbe ezinaụlọ Jekọb sitekwara nʼebe ndị asụsụ ha dị iche pụta,
2 Juda ghọrọ ebe nsọ Chineke,
Izrel ghọrọ ala ọ na-achị.
 
3 Osimiri hụrụ ya, gbaa ọsọ,[a]
osimiri Jọdan hụkwara ya chigharịa laa azụ[b];
4 Ugwu ukwu niile wụliri elu dịka ebule;
ugwu nta niile wụlikwara elu dịka ụmụ atụrụ.
 
5 Gịnị mere gị oke osimiri, i ji na-agba ọsọ?
Osimiri Jọdan, gịnị na-eme gị i ji chigharịa laa azụ?
6 Gịnị na-eme unu, ugwu ukwu niile unu ji na-awụli elu dịka ụmụ ebule?
Gịnị na-emekwa unu, ugwu nta niile, unu ji na-awụli elu dịka ụmụ atụrụ?
 
7 Ka ụwa niile maa jijiji nʼihu Onyenwe anyị,
ka ọ maakwa jijiji nʼihu Chineke nke Jekọb,
8 onye mere ka oke nkume ghọọ ọdọ mmiri,
onye mere ka ọmụ nkume ghọọ isi iyi mmiri.[c]

<- Abụ Ọma 113Abụ Ọma 115 ->