5 Mgbe ahụ, Mosis nyere ndị Izrel ntụziaka site nʼiwu Onyenwe anyị sị, “Ihe ndị ikom ebo Josef na-ekwu ziri ezi. 6 Ma nke a bụ iwu Onyenwe anyị na-enye maka ụmụ ndị inyom Zelofehad. Ha nwere ike ịlụ onye ọbụla masịrị ha, ma onye ha ga-alụ ga-abụrịrị onye si nʼagbụrụ ebo nna ha. 7 O nweghị ihe nketa ọbụla nʼIzrel ga-esi nʼaka otu ebo gafee nʼebo ọzọ. Nʼihi na ihe nketa nke ebo ọbụla ga-adịgidere ha dịka otu e siri kee ya nye nna nna ha. 8 Nwa nwanyị Izrel ọbụla ketara ala nʼebo Izrel ọ bụla ga-alụ di site nʼagbụrụ ebo nna ya. Ka ala ha ghara ịgafere ebo ọzọ. 9 Ọ dịghị ihe nketa ọbụla ga-esi nʼotu ebo feere ebo ọzọ. Nʼihi na ebo Izrel ọbụla ga-edebere onwe ha ala ha ketara.”
10 Ya mere, ụmụ ndị inyom Zelofehad mere dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu. 11 Ụmụ Zelofehad ndị a: Mahla, na Tịaza, na Hogla, na Milka, na Noa, lụrụ ndị ikom si nʼebo nna ha. 12 Ha lụrụ di nʼagbụrụ ụmụ Manase, nwa Josef. Nʼụzọ dị otu a, ihe nketa ha dịgidere nʼebo na agbụrụ nna ha.