1 Nʼoge a, Belam aghọtala nʼuche ya na ọ masịrị Onyenwe anyị ịgọzi Izrel. Ya mere, ọ họrọghị ịgba afa dịka o mere nʼoge ndị gara aga, kama o chere ihu ya nʼọzara. 2 Mgbe Belam lepụrụ anya ọ hụrụ ụmụ Izrel dịka ha si maa ụlọ ikwu nʼebo nʼebo. Mgbe ahụ kwa, Mmụọ nke Chineke dakwasịrị ya. 3 O buru amụma ndị a sị,
“Okwu si nʼọnụ Belam nwa Beoa pụta,
okwu onye ahụ anya ya saghere asaghe.
4 Okwu onye ahụ na-anụ okwu Chineke
onye na-ahụ ọhụ site nʼaka onye pụrụ ime ihe niile.
Onye na-ada nʼala ma anya ya na-eghe oghe.
5 “Lee ka ebe obibi gị si maa mma, gị Jekọb,
ebe obibi gị niile, gị Izrel!
6 “Dịka ndagwurugwu dị iche iche ka ha gbasapụrụ,
dịka ubi a gbara ogige dị nʼakụkụ osimiri,
dịka osisi aloos nke Onyenwe anyị kụrụ,
dịka osisi sida dị nʼakụkụ mmiri.
7 Mmiri ga-esi nʼite mmiri ha na-erupụta,
mkpụrụ ha ga-enwekwa mmiri dị ukwuu.
“Eze ha ga-adị ukwuu karịa Agag,
a ga-ebulikwa alaeze ha elu.
8 “Chineke sitere nʼala Ijipt kpọpụta ha.
Ha nwere ike dịka atụ.
Ha ga-eripịa mba niile na-ebili imegide ha.
Ha ga-anyajisi ọkpụkpụ ha niile,
jirikwa ọtụtụ àkụ ha gbatuo ha.
9 Ha na-amakpuru, dinara ala dịka ọdụm,
dịka nne ọdụm, onye pụrụ ịkpọte ha?
“Ngọzị na-adịrị onye ọ bụla na-agọzi gị,
ma ọbụbụ ọnụ na-adịrị onye ọbụla na-akọcha gị.”
10 Iwe Balak dị ọkụ megide Belam nʼoge a. Ọ kụkọtara aka ya abụọ nʼiwe. Tie mkpu sị Belam, “Akpọrọ m gị ka ị bịa bụọrọ m ndị iro m ọnụ. Ma ị gọziela ha ugboro atọ a. 11 Si nʼebe m nọ wezuga onwe gị! Laghachi nʼụlọ gị! Akwadobere m inye gị ọnọdụ dị elu, ma Onyenwe anyị e gbochiela gị inweta ụgwọ ọrụ a.”
12 Belam zara Balak sị, “Ọ bụ na m agwaghị ndị ozi gị niile, bụ ndị ị zitere m, 13 ‘na a sịkwarịị na Balak enye m ọlaọcha na ọlaedo niile nke dị nʼụlọeze ya, apụghị m ime ihe ọbụla nʼike aka, maọbụ ihe ọma maọbụ ihe ọjọọ, ị gabiga iwu Onyenwe anyị. Ọ bụkwa naanị ihe Onyenwe anyị na-ekwu ka m ga-ekwu’? 14 Ugbu a, ana m alakwuru ndị m, ma bịa, ka m dọọ gị aka na ntị banyere ihe ndị a ga-eme ndị gị nʼụbọchị ndị a na-abịa nʼihu.”
Amụma Belam nke anọ
15 Ya mere Belam kwuru okwu ndị a:
“Amụma Belam nwa Beoa,
amụma nke onye ahụ anya ya nʼahụ ụzọ nke ọma,
16 amụma onye ahụ nke na-anụ okwu Chineke,
onye ihe ọmụma ya si nʼebe Onye kachasị ihe niile elu na-abịa.
Onye na-ahụ ọhụ site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile.