7 Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,
“Lee, aga m anụcha ha, nwaa ha ọnwụnwa.
Gịnị ọzọ ka m kwesiri ime
nʼihi mmehie ndị m?
8 Ire ha na-egbu dịka àkụ.
Ọ bụ naanị okwu aghụghọ si na ya apụta.
Ha ji ọnụ ha na-agwarịta ibe ha okwu udo,
ma nʼime obi ha, ha na-esirịtara onwe ha ọnya igbudu.”
9 Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara sị,
“M ga-aghara ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile?
M ga-ahapụ ịbọrọ onwe m ọbọ
megide mba dị otu a?”
10 Aga m anọ nʼelu ugwu ukwu kwa akwa.
Nʼebe ahụ ka m ga-anọ kwaa ụwa m nʼihi ebe ịta nri nke anụmanụ ndị ahụ dị nʼọzara.
Ha tọgbọrọ nʼefu. Ọ dịghị onye na-ejegharị nʼime ya.
A naghị anụkwa olu anụ ụlọ nʼebe ahụ.
Ụmụ nnụnụ efefusịala.
Otu a kwa, ụmụ anụmanụ alaala.
11 “Aga m eme ka Jerusalem ghọọ ebe a na-awụfu unyi.
Ọ ga-aghọ ebe nkịta ọhịa na-awagharị na-achọ nri.
Aga m ekposa obodo niile nke Juda.
Ọ dịkwaghị onye ga-ebi na ya.”
12 Olee onye ahụ maara ihe, nke nwere ike ịghọta ihe ndị a niile? Onye ka Onyenwe anyị ziri ihe ndị a, nke ga-akọwa ya? Gịnị mere e ji bibie ala a, kposaa ya, mee ka ọ tọgbọrọ nʼefu dịka ọzara mmadụ na-enweghị ike ịgafe?
13Onyenwe anyị kwuru sị, “Ọ bụ nʼihi na ha agbakụtala iwu ahụ m nyere ha idebe azụ. Ha jụrụ irubere m isi, jụkwa ịgbaso iwu m. 14 Kama, ha na-agbaso isiike nke obi ha, ha gbasoro chi Baal dịka nna nna ha si kuziere ha.” 15 Nʼihi ya, nke a bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke Izrel kwuru, “Lee, aga m eme ka ndị a rie nri na-akụ ilu. Ha ga-aṅụkwa mmiri e tinyere nsi. 16 Aga m ekposa ha na mba niile nke ụwa. Ha ga-ebi na mba nke ha na nna ha na-amaghị. Aga m eji mma agha chụọ ha ọsọ tutu ruo mgbe m bibiri ha niile.”
17 Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,
“Tụgharịanụ uche unu ugbu a. Kpọọnụ ụmụ nwanyị ndị ọrụ ha bụ ịbụ abụ akwa.
20 Ugbu a, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ụmụ nwanyị,
megheenụ ntị unu nụrụ okwu si ya nʼọnụ.
Kuzierenụ ụmụ unu ndị inyom otu e si eti mkpu akwa,
kuziekwaranụ ibe unu abụ akwa.
21 Nʼihi na ọnwụ abatala nʼetiti anyị, o si na oghereikuku niile nke ụlọ anyị
bata nʼebe niile e wusiri ike nke ala anyị.
O gbuola ụmụntakịrị ndị na-ejegharị nʼokporoụzọ,
gbukwaa ụmụ okorobịa ndị na-anọ nʼama.
22 Gwa ha, sị, “Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,
“ ‘Ozu ndị nwụrụ anwụ ga-atọgbọrọ
dịka unyi e kpofuru nʼọhịa,
dịka ukwu ọka nke e gbuturu nʼazụ onye na-aghọ mkpụrụ ubi,
nke ọ dịghị onye ga-achịkọta ha.’ ”
23 Otu a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Ka onye maara ihe hapụ ịnya isi nʼihi amamihe ya,
ka onye dị ike ghara ịnya isi nʼihi ịdị ike ya,
ka ọgaranya hapụkwa ịnya isi nʼihi ịba ụba nke akụ ya,
24 kama, onye ọbụla na-anya isi, ya nyaa isi nʼihi nke a:
na o nwere uche ịghọta na mụ onwe m bụ,
Onyenwe anyị nke na-eme obi ebere,
na-ekpe ikpe ziri ezi na ezi omume nʼụwa.
Nʼihi nʼihe ndị a ka m na-enwe obi ụtọ,”
ka Onyenwe anyị kwubiri.
25 “Lee, ụbọchị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-ata ndị ahụ niile nke e biri ugwu naanị nʼanụ ahụ ha ahụhụ. 26 Ya bụ ndị Ijipt, Juda, Edọm, Amọn, na Moab, na ndị ahụ niile bi nʼọzara nʼebe dị anya. Nʼihi na, nʼezie, mba ndị a niile bụ ndị a na-ebighị ugwu. Ọ bụladị ụlọ Izrel niile bụ ndị a na-ebighị ugwu nʼime obi ha.”