4 Nʼihi ya, nʼafọ nke itoolu, nke ọchịchị Zedekaya, nʼụbọchị nke iri nʼọnwa nke iri, nke afọ ahụ, Nebukadneza, eze Babilọn, duuru usuu ndị agha ya niile bịa ibuso Jerusalem agha. Ha mara ụlọ ikwu ndị agha nʼazụ obodo ahụ, wuokwa mgbidi nnọchibido gburugburu obodo ahụ. 5 Anọchibidoro obodo a nʼagha ruo nʼafọ nke iri na otu nke ọchịchị eze Zedekaya.
6 Nʼabalị nke itoolu, nke ọnwa anọ nʼafọ ahụ, oke ụnwụ siri ike dị nʼobodo ahụ ruo na ọ dịkwaghị nri dị nke ndị mmadụ ga-eri. 7 Mgbe ahụ, e tipuru oghere nʼaja mgbidi obodo ahụ, ndị agha niile ji abalị gbapụ site nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼetiti mgbidi abụọ nʼakụkụ ubi eze a gbara ogige, nʼagbanyeghị na ndị Babilọn[a] nọ obodo ahụ gburugburu. Ha gbapụrụ chee ihu nʼụzọ Araba.[b] 8 Ma usuu ndị agha Babilọn[c] chụsoro Zedekaya bụ eze nʼazụ, chụkwute ya na mbara ala Jeriko. Ndị agha ya niile sitere nʼebe ọ nọ gbasasịa, hapụ ya, 9 e jide ya.
12 Nʼụbọchị nke iri, nʼọnwa nke ise, nke afọ iri na itoolu, nke ọchịchị Nebukadneza eze Babilọn, Nebuzaradan ọchịagha ndị nche eze, onye na-ejere eze Babilọn ozi, bịarutere Jerusalem. 13 O sunyere ụlọnsọ Onyenwe anyị ọkụ, ụlọeze na ụlọ niile dị na Jerusalem, ụlọ ọbụla bụ nke dị mkpa ka o surere ọkụ. 14 Usuu ndị agha Kaldịa niile bụ ndị nọ nʼokpuru onyeisi ndị nche eze ahụ, kwaturu mgbidi ahụ niile gbara Jerusalem gburugburu. 15 Nebuzaradan, ọchịagha ndị nche eze, buru ụfọdụ nʼime ndị dakarịsịrị nʼogbenye na ndị fọdụrụ nʼime obodo ahụ, ha na ndị ǹka niile fọdụrụ, na ndị ahụ ji aka ha gbakwuru eze Babilọn, bulaa ha Babilọn, ka ha ga biri nʼala ọzọ. 16 Ma Nebuzaradan, hapụrụ ndị ahụ bụ nnọọ ndị ogbenye ọnụ ntụ,[d] ka ha na-elekọta ubi vaịnị niile a gbara ogige na ala ubi niile.
17 Ma ndị Babilọn tipịara ogidi bronz niile, ha na ihe ndọkwasị niile na Oke osimiri bronz ndị ahụ dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, buru bronz ahụ niile bulaa Babilọn. 18 Ha chịkọọrọ ite niile, na shọvel niile na ihe ịkpakepụ ọkụ niile, na efere ịkwọsa mmiri niile, na ngaji ukwu niile, na ihe bronz niile, bụ nke e ji eje ozi nʼime ụlọnsọ ahụ. 19 Ọchịagha ndị nche eze ahụ sikwa nʼụlọnsọ ahụ chịrị ihe ndị a: efere ukwu niile, ihe ịgụnye ọkụ niile, efere ịkwọsa mmiri niile, ite niile, ihe ịdọkwasị oriọna niile, ngaji ukwu niile na iko e ji enye onyinye ihe ọṅụṅụ, ya bụ ihe ndị ahụ niile e ji ọlaedo a nụchara anụcha maọbụ ọlaọcha kpụọ.
20 O burukwara bronz sitere nʼogidi abụọ ahụ, oke Osimiri ahụ na ehi iri na abụọ e ji bronz kpụọ, bụ nke dị nʼokpuru ya, na ihe ndọkwasị ya niile, nke eze bụ Solomọn mere nʼihi ụlọnsọ Onyenwe anyị. Ha karịrị ihe a ga-eji ihe ọtụtụ tụọ. 21 Ị dị elu nke otu nʼime ogidi abụọ ndị a bụ mita asatọ na ụma[e] nʼọtụtụ. Ị dị gburugburu ya bụkwa mita ise na ụma anọ,[f] nke ọbụla nʼime ha bụ mkpịsịaka anọ. Oghere dịkwa nʼime ha. 22 Isi bronz nke e kpụkwasịrị nʼotu ogidi dị mita abụọ na ụma atọ[g] nʼịdị elu. Ọ bụkwa ihe yiri mkpụrụ pomegranet e ji bronz kpaa, ka e ji chọọ ya mma gburugburu ya niile. Ogidi nke abụọ nwekwara pomegranet, yiri ibe ya. 23 Pomegranet ndị ahụ dị iri itoolu na isii, ọ bụkwa nʼakụkụ ọbụla ka ọ dị. Ọnụọgụgụ pomegranet niile dị nʼelu ihe ahụ a kpụrụ akpụ dị otu narị.
24 Ọchịagha ndị nche eze ahụ, kpụụrụ Seraya, onyeisi nchụaja, na Zefanaya, bụ onye nchụaja na-esote ya nʼọkwa, na ndị nche atọ na-eche ọnụ ụzọ mbata dịka ndị mkpọrọ. 25 O sitere nʼetiti ndị ahụ fọdụrụ nʼobodo kpụụrụ otu onyeisi na-ahụ maka ndị agha, na ndị ikom asaa na-enye eze ndụmọdụ. O kpukwaara ode akwụkwọ, onye isi ọrụ na-ahụ maka ịmanye ndị ga-aga agha, jidekwa iri ndị ikom isii bụ ndị a hụrụ nʼime obodo ahụ. 26 Nebuzaradan, bụ ọchịagha kpụụrụ ha niile, dute ha nʼihu eze Babilọn na Ribla. 27 Nʼebe ahụ na Ribla, dị nʼobodo Hamat, ka eze nọ nye iwu ka e gbuo ha niile.