4 Nʼụbọchị na-eso ụbọchị ahụ ha gbusịrị Gedaliya, tupu mmadụ ọbụla anụ ihe banyere ya, 5 o nwere iri mmadụ asatọ, bụ ndị kpụchara afụọnụ ha, dọwasịa uwe ha, gbukasịakwa onwe ha ahụ, sitere nʼobodo Shekem, na Shaịlo na Sameria buuru onyinye ịnata ihuọma, na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-abịa nʼụlọnsọ
10 Ishmel dọtakwara ndị niile fọdụrụ nʼime Mizpa nʼagha. Ọ dọtara ụmụ ndị inyom eze nʼagha, dọtakwa ndị ahụ niile a hapụrụ nʼebe ahụ, bụ ndị ahụ Nebuzaradan, ọchịagha ndị nche eze mere ka Gedaliya nwa Ahikam bụrụ onye na-achị ha. Ishmel nwa Netanaya dọtara ha niile nʼagha duru ha na-achọ ịgbapụ gaa nʼala ndị Amọn.
11 Mgbe Johanan nwa Kariya, na ndịisi agha ahụ niile ya na ha nọ nụrụ ihe ọjọọ Ishmel nwa Netanaya mere, 12 ha duuru ndị agha ha niile pụọ ibuso Ishmel nwa Netanaya agha. Ha chụkwutere ya nʼebe dị nso nʼiyi ukwu Gibiọn. 13 Mgbe ndị ahụ niile Ishmel dọtara nʼagha hụrụ Johanan nwa Kariya na ndịisi agha so ya, ha ṅụrịrị ọṅụ. 14 Ndị ahụ niile Ishmel dọtara nʼagha na Mizpa, chigharịrị gafee nʼebe Johanan nwa Kariya nọ. 15 Ma Ishmel nwa Netanaya, na mmadụ asatọ nʼime ndị agha ya, gbapụrụ ọsọ gbanarị Johanan. Ha gbalagara nʼala ndị Amọn.
16 Mgbe ahụ, Johanan nwa Kariya na ndịisi agha niile ya na ha so duuru ndị ahụ niile ha napụtara site nʼaka Ishmel pụọ, bụ ndị ahụ Ishmel nwa Netanaya dọtara nʼagha na Mizpa, mgbe o buuru ụzọ gbuo Gedaliya nwa Ahikam. Ndị ọzọ Johanan si na Gibiọn durukwa bụ ndị a, ndị agha, na ndị inyom, na ụmụntakịrị, na ndịisi ụlọ ikpe. 17 Ha duuru ha na-aga, ma kwụsị nʼobodo Gerut Kimham, nke dị nso na Betlehem, ebe ha bu nʼobi ịga Ijipt, 18 nʼihi ịgbanarị ndị Babilọn. Ha tụrụ egwu ihe ndị Babilọn ga-eme ha nʼihi ogbugbu Ishmel nwa Netanaya gburu Gedaliya nwa Ahikam, onye eze Babilọn họpụtara ka ọ bụrụ onye na-achị ala ahụ.
<- Jeremaya 40Jeremaya 42 ->