10
Chineke na arụsị
1 Nụrụnụ ihe
“Unu amụtala ụzọ ndị mba ọzọ,
unu atụkwala ụjọ ihe ịrịbama niile nke na-apụta ihe na mbara eluigwe,
ọ bụ ezie na ndị mba dị iche iche na-atụ ha ụjọ.
3 Nʼihi na omenaala ndị mmadụ ahụ abaghị uru.
Ha na-aba nʼọhịa gbute osisi,
nke onye ǹka osisi na-eji anyụike pịara ha ihe.
4 Ha na-eji ọlaọcha na ọlaedo chọọ ihe ahụ a pịrị apị mma,
jiri mkpirisi igwe na ǹtu kụọ ya ka o sie ike,
ka ọ ghara ịda.
5 Arụsị ha yiri osisi eguzobere nʼubi kukumba maka iji chụọ anụ ufe ọsọ,
ha adịghị ekwu okwu.
A na-ebugharị ha nʼaka
nʼihi na ha adịghị eje ije.
Unu atụla ha egwu,
nʼihi na ha apụghị imerụ unu ahụ,
ha enwekwaghị ike imere unu ihe ọma ọbụla.”
6 O nweghị onye dịka gị, Onyenwe anyị .
Ị dị ukwuu.
Aha gị dị ukwuu, na-arụpụtakwa ihe dị ike.
7 Onye ka ọ bụ nke na-ekwesighị ịtụ gị egwu?
Ọ bụ gị bụ eze mba niile.
Ọ bụkwa gị ka e kwesiri ịtụ egwu.
Nʼetiti ndị niile maara ihe na mba niile,
na nʼalaeze niile,
ọ dịghị onye dịka gị.
8 Ha niile bụ ndị na-enweghị uche na ndị nzuzu.
Ọ bụkwa arụsị osisi na-abaghị uru na-ezi ha ihe.
9 A na-esite na Tashish bubata ọlaọcha e tipịaziri nke ọma,
site na Ụfaz bubata ọlaedo.
Ihe ahụ nke ọka osisi pịrị, nke ndị ọkpụ ụzụ ọlaedo chọrọ mma
ka a na-eyikwasị uwe na-acha anụnụ anụnụ, na uwe na-acha odo odo.
Ọ bụkwa ndị ǹka dị iche iche na-eme ha niile.
10 Ma naanị Onyenwe anyị bụ Chineke nʼezie.
Ọ bụ Chineke dị ndụ, na Eze nke ebighị ebi.
Mgbe iwe were ya, ụwa na-ama jijiji.
Mba niile apụghịkwa ịnagide iwe ya dị ọkụ.
11 “Ihe ndị a ka unu ga-agwa ha, ‘Chi ndị ahụ niile a na-esiteghị nʼaka ha mee eluigwe na ụwa niile ga-ala nʼiyi. A ga-ewezuga ha site nʼụwa na nʼokpuru eluigwe niile.’ ”
12 Ma Chineke sitere nʼike ya mee ụwa.
Ọ tọrọ ntọala ụwa mee ka o guzosie ike site nʼamamihe ya,
ọ jikwa nghọta ya setịpụ eluigwe niile.
13 Mgbe o bigbọrọ, mmiri niile nke dị nʼeluigwe na-ebigbọkwa.
Ọ na-eme ka igwe ojii site na nsọtụ niile nke ụwa kwụlie.
Ọ na-ezipụ amụma mgbe mmiri na-ezo,
na-esitekwa nʼụlọ nkwakọba ihe ya niile na-ewepụta ifufe.
14 Onye ọbụla bụ onye na-enweghị uche nke ihe ọmụma kọrọ.
Emeela ka ihere mee onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ọbụla site nʼarụsị ọ kpụrụ.
Nʼihi na oyiyi niile ọ na-akpụ bụ aghụghọ;
ha enweghị nkuume ọbụla nʼime ha.
15 Ha bụ ihe efu, na ihe ịkwa emo,
mgbe ikpe ọmụma ha bịakwasịrị ha, ha ga-ala nʼiyi.
16 Ma Onye ahụ bụ Oke Jekọb adịghị ka ihe ndị a,
nʼihi na Ọ bụ ya na-eke ihe niile,
tinyere Izrel bụ ebo nke ihe nketa ya.
Mbibi nke na-abịa
17 Chịkọtaanụ ngwongwo unu niile; nọọnụ na njikere ịhapụ ala a,
nʼihi na lee, ndị iro gbara unu gburugburu.
18 Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Nʼoge a, aga m amafu
ndị niile bi nʼala a.
M ga-eme ka oke mkpagbu bịakwasị ha,
meekwa ka ndị iro ha jide ha.”
19 Ahụhụ dịịrị m nʼihi mmerụ ahụ m merụrụ.
Ọnya dị m nʼahụ enweghị ọgwụgwọ.
Ma ana m akasị onwe m obi na-asị,
“Nʼezie, ọrịa a dakwasịrị m bụ ọrịa m, aga m edikwa ya.”
20 Ebibiela ụlọ ikwu m,
e tibisiala ụdọ ya niile.
Ụmụ m ndị ikom esitela nʼebe m nọ pụọ, ha anọkwaghị ya.
Ọ dịkwaghị onye fọdụrụ nke ga-enyere m aka isetipụ ụlọ ikwu m,
maọbụ onye ga-edoziri m ebe m ga-anọ zuo ike.
21 Nʼihi na ndị ọzụzụ atụrụ a enweghị uche.
Ha adịghị ajụta ase site nʼaka Onyenwe anyị ,
ya mere, na ihe adịghị agara ha nke ọma,
igwe atụrụ ha niile agbasasịakwala.
22 Gee ntị, nụrụ! Lee ozi na-abịa,
oke ụzụ nke ọgbaaghara site nʼala dị nʼugwu,
ime ka obodo niile nke Juda tọgbọrọ nʼefu,
ghọọkwa ebe obibi nye nkịta ọhịa.
Ekpere Jeremaya
23 O Onyenwe anyị , amaara m na ụzọ mmadụ adịghị nʼaka ya,
na ọ bụghị mmadụ ka ọ dịịrị ịtụziri onwe ya ụzọ nke ọ ga-agbaso.
24 Ya mere, Onyenwe anyị , site nʼụzọ nke ikpe ziri ezi dọọ m aka na ntị,
ma ọ bụghị site nʼiwe gị,
ma ọ bụghị ya, ị ga-eme ka m ghọọ ihe efu.
25 Wụkwasị ọnụma gị nʼelu mba niile dị iche iche
bụ ndị na-amaghị gị,
wụkwasịkwa ya ndị ahụ niile na-adịghị akpọku aha gị.
Nʼihi na ha eripịala Jekọb,
ha eripịala ya kpamkpam,