4 Ya mere, onye Livayị ahụ, di nwanyị ahụ e gburu kwuru sị, “Mụ na iko m nwanyị bịaruru obodo Gibea, obodo nta ndị Benjamin, kwụsị nʼebe ahụ ịnọ ọnọdụ abalị. 5 Nʼoge abalị, ndị ikom Gibea bịara gba ụlọ anyị nọ nʼime ya gburugburu. Nzube ha bụ igbu m. Ma ha jidere iko m nwanyị, dinakwuru ya nʼike, tutu ruo mgbe ọ nwụrụ. 6 Nʼihi ya, abọwasịrị m ahụ iko m nwanyị ụzọ iri na abụọ, zisa ya nʼakụkụ niile nke ihe nketa ndị Izrel niile nʼihi na ndị ikom Gibea ndị ahụ emeela ihe ọjọọ na ihe ihere nʼala Izrel. 7 Ugbu a, unu ụmụ Izrel niile, unu onwe unu tụleenụ okwu a, nyekwanụ ndụmọdụ ihe a ga-eme ebe a.”
8 Ndị mmadụ niile kulitere dịka otu onye, sị, “O nweghị onye ọbụla ga-ala na be ya. O nweghị onye ọbụla ga-esi nʼebe a laa nʼụlọ ya. 9 Ma ugbu a, nke a bụ ihe anyị ga-eme ndị Gibea. Anyị ga-efe nza chọpụta ndị ga-aga lụso ndị Gibea agha. 10 Anyị ga-esite nʼebo niile nke Izrel họpụta mmadụ iri site na narị mmadụ, họpụta narị mmadụ site na puku mmadụ, họpụtakwa puku mmadụ site nʼiri puku mmadụ, ka ha hụ maka iwetara ndị agha ihe oriri. Mgbe ndị agha a rutere Geba dị na Benjamin, anyị pụrụ ịkwụghachi ha ụgwọ ruru ha dịka ihe ihere niile ha mere nʼala Izrel si dị.” 11 Ya mere, ndị Izrel niile jikọtara onwe ha ọnụ ibu agha ahụ dịka otu onye, megide obodo ahụ.
12 Ndị ebo Izrel zipụrụ ndị ozi ka ha gazuo ebo Benjamin niile, sị ha, “Gịnị bụ ihe ọjọọ nke a jọgburu onwe ya emere nʼetiti unu? 13 Ugbu a, kpọpụtara anyị ndị ikom ọjọọ dị a si nʼobodo Gibea ka anyị gbuo ha. Anyị ga-esikwa otu a hichapụ ihe ọjọọ a site nʼIzrel.”
17 Ma ọnụọgụgụ ndị agha ụmụ Izrel, ma ọ bụrụ na e wezuga ụmụ Benjamin, dị narị puku anọ.
18 Ma tupu agha ahụ ebido, ndị agha Izrel buru ụzọ gaa Betel ịjụta Chineke ase. Ha jụrụ ya sị, “Olee ebo ga-edu anyị ibuso ndị agha Benjamin agha?”
19 Nʼihi nke a, nʼisi ụtụtụ echi ya, ndị agha ụmụ Izrel niile buliri ihe agha ha pụọ, maa ụlọ ikwu ha nso nso Gibea. 20 Emesịa, ndị Izrel pụrụ izute ndị Benjamin, doo onwe ha nʼusoro ibu agha na Gibea. 21 Ma nʼụbọchị ahụ, ndị Benjamin si Gibea nupụta nʼigwe gbuo ndị agha Izrel ọnụọgụgụ ha dị iri puku abụọ na puku abụọ. 22 Ndị agha Izrel gbarịtara onwe ha ume, ma werekwa ọnọdụ ibu agha dịka ha mere nʼụbọchị mbụ. 23 Ndị agha Izrel kwara akwa nke ukwuu nʼụbọchị ahụ nʼihu Onyenwe anyị site nʼụtụtụ ruo anyasị. Ha jụrụ Onyenwe anyị ase ọzọ sị ya, “Anyị ga-aga nʼihu ịlụso ụmụnna anyị ndị Benjamin ọgụ?”
24 Nʼihi nke a, ndị Izrel jeghachikwara ọzọ ibuso ụmụ Benjamin agha nʼụbọchị nke abụọ ya. 25 Nʼoge a kwa, ndị agha Benjamin si nʼobodo Gibea pụta ibuso ha agha. Ha gburu ndị agha Izrel ọnụọgụgụ ha dị puku iri na asatọ. Ndị a niile bụkwa ndị ji mma agha ebu agha.
26 Mgbe ahụ, ndị Izrel niile gara Betel, nọdụ nʼebe ahụ, kwaa akwa nʼihu Onyenwe anyị Ha erighị nri ọbụla nʼụbọchị ahụ site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị. Ha chere nʼihu Onyenwe anyị onyinye aja udo, ma chụọkwa aja nsure ọkụ. 27 Ndị Izrel jụrụ ase site nʼaka Onyenwe anyị. (Nʼoge ndị ahụ, igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị nʼebe ahụ. 28 Finehaz nwa Elieza, nwa nwa Erọn na-eje ozi nchụaja nʼebe ahụ.) Ụmụ Izrel jụrụ Onyenwe anyị ase sị ya, “Ọ bụ anyị gaakwa ọzọ ibuso ụmụnna anyị ndị Benjamin agha, ka ị sị anyị agala?”
29 Nʼihi nke a, ụmụ Izrel kewapụtara ndị zoro onwe ha nʼọhịa, gburugburu obodo Gibea. 30 Nʼụbọchị nke atọ ya, ha pụrụ gaakwa izute ndị Benjamin, ha were ọnọdụ ha imegide ndị Gibea dịka ha mere nʼoge gara aga. 31 Ndị Benjamin pụtara izute ha, e mere ka ha site nʼobodo pụọ. Ha malitere igbu ndị Izrel dịka ha mere na mbụ, nke mere na ndị ikom iri atọ dara nwụọ nʼọhịa ma na ụzọ, otu nke gawara obodo Betel, na nke ọzọ gawara obodo Gibea. 32 Ya mere, mgbe ndị agha Benjamin malitere na-asị, “Lee, anyị emeriela ha dịka anyị mere na mbụ,” ndị Izrel nọ na-ekwu sị, “Ka anyị gbara ọsọ na-aga ruo mgbe ha ga-anọ ebe dị anya site nʼobodo ha.”
33 Ndị ikom niile nke Izrel sitere nʼọnọdụ ha bilie, doo onwe ha nʼusoro na Baal-Tama, ndị Izrel ndị zoro onwe ha wapụtara site nʼọnọdụ ha nʼọdịda anyanwụ nke Geba, si nʼọhịa mapụta. 34 Iri puku ndị ikom Izrel ahụ zuruoke gara na ncherita ihu Gibea busoo ya agha. Agha ahụ dị ike nke ukwuu nke mere na ndị Benjamin amataghị na oke mbibi na-abịakwasị ha. 35 Onyenwe anyị meriri ndị Benjamin nʼihu Izrel, nʼụbọchị ahụ; ndị Izrel gburu ndị agha Benjamin ọnụọgụgụ ha dị iri puku abụọ, na puku ise, na otu narị. Ha niile bụkwa ndị na-eji mma agha aga agha. 36 Mgbe ahụ, ndị Benjamin nʼonwe ha, hụrụ na e emeriela ha.
46 Ya mere, ndị Benjamin e gburu nʼagha nʼụbọchị ahụ dị iri puku abụọ, na ise. Ndị a bụ ndị agha mma agha, dike na dimkpa nʼagha. 47 Naanị narị ndị agha isii nʼime ha tụgharịrị gbapụ ọsọ gbalaga nʼọzara, nʼebe nkume Rimọn dị. Ha nọgidere nʼebe ahụ ọnwa anọ. 48 Mgbe ahụ, ndị agha Izrel hapụrụ ha, laghachi azụ, gaa nʼobodo ndị Benjamin niile gbuo ndị niile nọ nʼime ha, igwe anụ ụlọ, na ihe ndị ọzọ niile dị nʼime ha. Obodo niile ha ruru, ha kpọrọ ha ọkụ.
<- Ndị Ikpe 19Ndị Ikpe 21 ->- a Nkp 3:16; 1Ih 12:2