2 Nna ya sịrị, “O doro m anya na ị kpọrọ nwa m nwanyị asị, ọ bụ nʼihi nke a ka m jiri kenye ya enyi gị nwoke ka ọ bụrụ nwunye ya. Nwanne ya nwanyị nke nta, ọ maghị mma karịa ya? Kpọrọ ya ka ọ nọchie anya ya.”
3 Samsin sịrị ha, “Nʼoge a, o ziri m ezi ị bọkwara ọbọ nʼebe ndị Filistia nọ.” Aghaghị m imesi ha ike. 4 Ya mere, Samsin pụrụ gaa jide narị nkịta ọhịa atọ, wetakwa ọwa ụfọdụ. O kekọtara ọdụdụ ha abụọ abụọ. O kenyere ọwa nʼagbata otu nkịta ọhịa na ibe ya. 5 Emesịa, ọ mụnyere ọkụ nʼọwa ahụ niile. O mekwara ka nkịta ọhịa ndị ahụ dọkpụrụ ọwa a mụnyere ọkụ baa nʼubi ọka ndị Filistia, si otu a rechapụ ọka niile guzoro eguzo nʼubi, na ubi vaịnị niile, ha na osisi oliv niile ọkụ.
6 Mgbe ndị Filistia chọpụtara ihe mere, ha jụrụ sị, “Onye mere ihe dị otu a?” A gwara ha, “Ọ bụ Samsin ọgọ onye Timna, nʼihi na a kpọnyere enyi ya nwunye ya.”
9 Ndị Filistia gara maa ụlọ ikwu ha nʼala Juda, gbasaa nʼala ahụ ruo obodo Lehi. 10 Ndị Juda jụrụ ajụjụ sị ha; “Ọ bụ gịnị mere unu ji bịa nʼebe a ibuso anyị agha?”
11 Nʼihi nke a, ndị Juda zipụrụ puku ndị agha ka ha gaa jide Samsin nʼọgba nkume ahụ nke Etam. Ndị a bịara jụọ Samsin ajụjụ sị ya, “Gịnị bụ ihe a i mere anyị? Ọ bụ na ị maghị na ndị Filistia na-achị obodo anyị?”[b]
12 Ha sịrị ya, “Anyị abịala ka anyị kee gị agbụ, dọkpụrụ gị, nye nʼaka ndị Filistia.”
13 Ha zara sị ya, “Anyị agaghị egbu gị kama anyị ga-eke gị agbụ.” Ya mere, ha kere ya agbụ, duru ya jekwuru ndị Filistia. 14 Mgbe ọ na-abịaru Lehi, ndị Filistia tiiri mkpu, bịa izute ya. Mmụọ Onyenwe anyị bịakwasịrị Samsin nʼebe ọ dị ukwuu. Nke a mere ka eriri ahụ e kere ya nʼaka dịrị ka eriri ogho flakisi erere ọkụ, sitekwa nʼaka ya dapụsịa. 15 Mgbe ahụ Samsin lere anya gburugburu, hụ ọkpụkpụ agba ịnyịnya ibu nke tọgbọrọ nʼala nʼebe ahụ. Ọ tụtụlitere ya, were ya tigbuo puku ndị agha Filistia.
16 Mgbe ahụ, Samsin kwuru sị,
18 Nʼoge a, akpịrị kpọrọ Samsin nkụ nke ukwuu, nʼihi ya, ọ kpọkuru Onyenwe anyị nʼekpere sị, “Lee, i nyela ohu gị mmeri a dị ukwuu! Ma ugbu a, ị ga-ekwe ka m nwụọ nʼihi akpịrị ịkpọ nku, si otu a daba nʼaka ndị a na-ebighị ugwu?” 19 Chineke gbawara olulu ahụ nke dị nʼime Lehi, mee ka mmiri si na ya nupụta. Mgbe Samsin ṅụrụ mmiri ahụ, ike ya lọghachiri, mmụọ ya bịaghachikwara. Ya mere, a kpọrọ isi iyi ahụ En-Hakkore. Mmiri ala ahụ ka dịkwa na Lehi nʼebe ahụ ruo taa.
20 Ya mere, Samsin kpere ụmụ Izrel ikpe iri afọ abụọ nʼoge ndị Filistia.
<- Ndị Ikpe 14Ndị Ikpe 16 ->- a Mgbe nwoke lụrụ nwanyị, ọ bụrụ na nna nwanyị dị otu a a naraghị ego isi akụ, ọ bụ onyinye nwa ewu nta ka ọ ga-ewegara nwunye ya ahụ, mgbe ọbụla ọ gara ihu ya. Nwanyị ahụ ga-ebikwa nʼụlọ nna ya, nʼihi na nna ya a naghị ego akụ nʼisi ya. Ma mgbe ọbụla di nwanyị ahụ ga-abịa, ọ ga-ewetara ọgọ ya ọtụtụ onyinye. Nwa ewu nta bụ onyinye onye ọbụla na-enye nʼoge ahụ. Jen 38:17
- b Lev 26:25; Dit 28:43; Nkp 13:1; 14:4; Abụ 106:40-42