2 Jefta zaghachiri ha sị, “Akpọrọ m unu mgbe mụ na ndị m na ndị Amọn na-ese okwu dị ukwu ma unu jụrụ ịbịa. Unu azọpụtaghị m site nʼaka ha. 3 Mgbe m hụrụ na unu achọghị inyere anyị aka, e tinyere m ndụ m nʼaka m, gabiga nʼofe nke ọzọ ibuso ndị Amọn agha. Ma Onyenwe anyị nyeere m aka imeri ha. Ugbu a, nʼihi gịnị ka unu ji bịa ịlụso m ọgụ taa?”
4 Jefta kpọkọtara ndị ikom Gilead pụọ buso ndị Ifrem agha. Ndị Gilead tidara ha nʼala nʼihi na ndị Ifrem sịrị, “Ndị gbapụrụ agbapụ site nʼIfrem na Manase ka unu bụ.” 5 Ọ nọchiri akụkụ Jọdan dị ndị agha Ifrem nʼazụ, ebe ndị agha Ifrem nwere ike isi gbapụ. Mgbe ọbụla onye agha Ifrem ọbụla gbapụrụ ọsọ chọọ ịgafe osimiri ahụ, ndị agha Gilead ga-ejide ya jụọ ya sị, “Ị bụ onye Ifrem?” Ọ bụrụ na onye ahụ ekwuo na ya abụghị onye Ifrem, 6 ha sịrị, “Ọ dị mma, kpọọ, ‘Shibolet.’ ” Ọ bụrụ na onye ahụ akpọ, “Sibolet,” nʼihi na ọ kpọpụtaghị mkpụrụ okwu ahụ nke ọma, ha na-akpụrụ ya gbuo ya na ngabiga mmiri Jọdan. Ọ bụ ọnụọgụgụ iri puku anọ, na puku abụọ ndị Ifrem ka e gburu mgbe ahụ.
7 Jefta duuru ndị Izrel afọ isii. Mgbe ọ nwụrụ, e liri ya nʼotu obodo Gilead.
11 Onye ọzọ kpere Izrel ikpe bụ Elọn, onye Zebụlọn. O kpere Izrel ikpe afọ iri. 12 Emesịa, Elọn nwụrụ, e lie ya nʼAijalon, nʼime ala Zebụlọn.
13 Onye ọzọ kpere Izrel ikpe bụ Abdon nwa Hilel, onye Piraton. 14 O nwere iri ụmụ ndị ikom anọ na iri ụmụ ụmụ atọ ndị na-agba iri ịnyịnya ibu asaa. O kpere ụmụ Izrel ikpe afọ asatọ. 15 Mgbe ahụ, Abdon nwa Hilel nwụrụ, e lie ya na Piraton ala dị nʼIfrem, nʼobodo ugwu ndị Amalek.
<- Ndị Ikpe 11Ndị Ikpe 13 ->- a Obodo Betlehem nke a dị nʼala Zebụlọn, ọ dịghị na Juda.