11 Ma Onyenwe anyị sịrị ndị Izrel, “Mgbe ndị Ijipt, ndị Amọrait, ndị Amọn, ndị Filistia, 12 ndị Saịdọn, ndị Amalek na ndị Maon kpagburu unu; unu tikuru m mkpu akwa inyere unu aka, ọ bụ na m anapụtaghị unu site nʼaka ha? 13 Ma unu nọgidere na-agbakụta m azụ oge niile, na-efe chi ndị ọzọ ofufe. Ya mere, gawaranụ onwe unu, agaghị m anapụtakwa unu ọzọ. 14 Kpọkuonụ chi ndị ahụ bụ ndị unu họpụtaara onwe unu, ka ha zọpụta unu mgbe ọbụla nsogbu dakwasịrị unu!”
15 Ma ndị Izrel sịrị Onyenwe anyị, “Anyị emehiela. Mee anyị ihe ọbụla i chere dị gị mma, ma biko, zọpụta anyị taa.” 16 Ha sitere nʼetiti ha wezuga chi ala ọzọ niile dị iche iche, fee Onyenwe anyị ofufe. O nweghịkwa ike nagide ọnọdụ ọjọọ ndị Izrel gaa nʼihu.
17 Mgbe a kpọkọtara ndị Amọn maka ibu agha, ha mara ụlọ ikwu ha na Gilead, ndị Izrel zukọtakwara maa ụlọ ikwu nke ha na Mizpa. 18 Ndị ndu obodo Gilead gwarịtara onwe ha sị, “Onye ọbụla ga-amalite agha megide ndị Amọn ga-abụ onyeisi ndị niile bi na Gilead.”
<- Ndị Ikpe 9Ndị Ikpe 11 ->- a Dit 1:10; 1Sa 12:10