2 Ma mgbe e mesịrị, ozi ruru ụlọ Devid ntị sị, “Ndị Aram na Ifrem ejikọọla onwe ha ọnụ”; nke a mere ka ụlọeze, na obi ndị ọ na-achị maa jijiji, dịka osisi dị nʼọhịa si ama jijiji mgbe oke ifufe na-efe.
3 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Aịzaya okwu sị ya, “Jekwuru Ehaz bụ eze. Mgbe ị na-aga, kpọrọ Shịa-Jashub nwa gị nwoke. Unu ga-ahụ Ehaz nʼakụkụ Elu elu olulu ọdọ mmiri nke dị nʼụzọ ahụ gawara nʼAla ọsụ akwa. 4 Gwa ya ka ọ ghara inye ndụ ya nsogbu, ka ọ gharakwa ịtụ egwu. Sị ya, ‘Lezie anya, nọ jụụ, echegbula onwe ya banyere icheku ọkụ abụọ ahụ na-anyụ anyụ. Atụla egwu nʼihi iwe Rezin nwa Aram, na iwe Peka nwa Remalaya. 5 E, Aram, na Ifrem, na nwa nwoke Remalaya, agbaala izu ibuso gị agha ịla gị nʼiyi. Ha ekwuola sị, 6 “Ka anyị wakpo Juda, ka anyị dọwaa ya ma kee ya nʼetiti onwe anyị, mee nwa Tabeel ka ọ bụrụ eze ya.” 7 Ma otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,
10 Ọ dịghị anya, Onyenwe anyị ziri Ehaz ozi ndị a sị, 11 “Jụọ m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, ka m meere gị ihe ịrịbama nke ga-egosi gị na m ga-ebibi ndị iro gị niile dịka m kwuru. Rịọọ m ihe masịrị gị, nʼebe dị elu nʼeluigwe maọbụ nʼebe kachasị omimi nʼụwa.”
12 Ma Ehaz zara sị, “Mba, agaghị arịọ, agaghị m anwakwa Onyenwe anyị m otu a.”
13 Ma Aịzaya sịrị, “Ṅaanụ ntị unu ụlọ Devid. Ọ bụ na o zurughị unu ime ka ike gwụ mmadụ? Unu ga-emekwa ka ike gwụ Chineke nʼonwe ya? 14 Ya mere, Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-enye gị ihe ịrịbama! Lee, nwaagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ọ ga-akpọ aha ya Ịmanụel, nke pụtara, Chineke nọnyeere anyị. 15 Mmiri ara ehi rahụrụ arahụ na mmanụ aṅụ ka nwantakịrị ahụ ga-eri mgbe ọ matara ịjụ ihe ọjọọ na ịhọrọ ezi ihe. 16 Tupu a zụlite nwantakịrị ahụ ịmata ịhọrọ ezi ihe na ịjụ ajọ ihe, ndị eze abụọ ndị ị na-atụ egwu ha, ga-anwụcha. 17 Onyenwe anyị ga-eme ka ọbụbụ ọnụ dị ukwuu bịakwasị gị na obodo gị, na ezinaụlọ gị. Ihe egwu ga-adịkwa, ụdị nke a na-ahụbeghị mbụ, site nʼoge e kewapụrụ Ifrem site na Juda. Eze Asịrịa ga-edu ndị agha ya bịa.‡2Ih 28:19-20”