1 Nʼoge ahụ, Hezekaya rịara ọrịa ruo na ọ gaara anwụ. Aịzaya onye amụma, nwa Emọz, bịakwutere ya, sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị: Dozie ezinaụlọ gị, nʼihi na ị ga-anwụ. Ị gaghị esite nʼute ọrịa a bilie.”
2 Hezekaya tụgharịrị chee ihu ya nʼaja ụlọ kpee ekpere nye Onyenwe anyị sị, 3 “Chetakwa, Onyenwe anyị, otu m si jegharịa nʼihu gị nʼikwesị ntụkwasị obi, jiri obi m niile fee gị ofufe, ma meekwa ihe dị mma nʼanya gị.” Hezekaya bekwara akwa nke ukwuu.
4 Mgbe ahụ, okwu nke Onyenwe anyị rutere Aịzaya, 5 “Gaa, gwa Hezekaya, sị ‘Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Chineke nna gị Devid kwuru, anụla m ekpere gị, ahụkwala m anya mmiri akwa gị. Aga m atụkwasị afọ iri na ise nʼụbọchị ndụ gị. 6 Aga m anapụtakwa gị na obodo a site nʼaka eze Asịrịa. Aga m echebe obodo a.
7 “ ‘Nke a bụ ihe ịrịbama site nʼaka Onyenwe anyị nye gị, na Onyenwe anyị ga-emezu ihe a nke o kwere na nkwa. 8 Aga m eme ka anyanwụ laa azụ nzọ ụkwụ iri nʼihe nrigo ụlọ elu Ehaz.’ ” Ya mere, anyanwụ laghachiri azụ nzọ ụkwụ iri.