11
Ome si nʼezinaụlọ Jesi
1 Ome ga-epupụta site nʼogwe osisi Jesi;
otu Alaka ga-esitekwa na mgbọrọgwụ ya tolite ga-amịkwa mkpụrụ.
2 Mmụọ Onyenwe anyị ga-enwekwa ọnọdụ nʼime ya,
inye ya Mmụọ amamihe na Mmụọ nghọta,
Mmụọ ndụmọdụ na ike,
Mmụọ ihe ọmụma na nke ịtụ egwu Onyenwe anyị.
3 Ihe ga-amasị ya bụ egwu Onyenwe anyị.
Ọ gaghị ekpe ikpe site naanị nʼihe o ji anya ya abụọ hụ,
maọbụ gbubie ikpe site naanị nʼihe ọ nụrụ na ntị ya.
4 Kama ọ bụ ezi omume ka ọ ga-eji kpee ndị ogbenye ikpe;
ọ bụkwa ikpe ziri ezi ka ọ ga-ekpere ndị na-adịghị ike nke ụwa.
Okwu ọnụ ka ọ ga-eji nye ndị mmadụ ahụhụ,
ọ bụ okwu ọnụ ka ọ ga-eji maa ndị ajọ omume ikpe ọnwụ.
5 Ezi omume ya ga-adị ka ihe ike nʼume,
ma ikwesi ntụkwasị obi ga-abụ ihe okike ukwu ya.
6 Nʼụbọchị ahụ, nkịta ọhịa na nwa atụrụ ga-ebikọ nʼudo;
agụ na nwa ewu ga-amakpukọkwa.
Nwa ehi na ụmụ ọdụm na nwa ịnyịnya mara abụba ga-anọkọtakwa,
ọ bụkwa nwantakịrị ga na-edugharị ha.
7 Nne ehi na anụ ọhịa bịa ga-atakọkwa ahịhịa nʼotu ebe,
ụmụ ha ga-amakpukọkwa nʼudo nʼotu ebe.
Ọdụm ga-atakwa ahịhịa dịka ehi.
8 Ụmụntakịrị ga-egwugharị egwu nʼakụkụ ọnụ ajụala;
nwantakịrị ga-etinyekwa aka nʼakwụ ibi.
9 Ha agaghị eme ihe mmerụ maọbụ bibikwa ihe,
nʼelu ugwu nsọ m niile.
Nʼihi na ụwa niile ga-ejupụta na ihe ọmụma
nke Onyenwe anyị dịka mmiri si ekpuchi oke osimiri.
10 Nʼụbọchị ahụ, mgbọrọgwụ Jesi ga-eguzo ka ọkọlọtọ nye ndị dị iche iche. Mba niile ga-abịakwute ya; ebe izuike ya ga-ejupụtakwa nʼebube. 11 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-esetikwa aka nke ugboro abụọ[a] inwetaghachiri onwe ya ndị ya fọdụrụ site na Asịrịa, sitekwa na ndịda Ijipt, sitekwa na Mgbago Ijipt,[b] sitekwa na Kush, sitekwa na Elam, sitekwa na Babilọn, bụ Shaịna, sitekwa na Hamat na obodo niile dị nʼala niile osimiri gbara gburugburu.
12 Ọ ga-ebuliri mba niile ọkọlọtọ
ọ ga-akpọghachite ụmụ Izrel achụpụrụ achụpụ,
ọ ga-esite na nsọtụ anọ nke ụwa
kpokọta ndị Juda niile site nʼebe a chụsasịrị ha.
13 Ekworo Ifrem ga-akwụsị,
a ga-ebipụ ndị iro Juda.
Nʼikpeazụ, ekworo ahụ nke dị nʼetiti Izrel na Juda ga-akwụsị[c];
ha agaghị alụsokwa onwe ha ọgụ ọzọ.
14 Ha ga-ejikọta aka ha buso ndị Filistia nọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ala ha agha;
ha ga-ebusokwa ndị bichiri nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ala ahụ agha.
Ha ga-emeri ndị Edọm na Moab.
Ndị Amọn ga-erubekwara ha isi.
15 Onyenwe anyị ga-eme
ka warawara ọnụ osimiri Ijipt taa.
Ọ ga-eji ifufe siri ike, nke na-ekpo ọkụ
mikọrọ mmiri dị nʼosimiri Yufretis.
Ọ ga-ekewa ya ka ọ bụrụ isi iyi asaa,
nke mmadụ nwere ike iji ụkwụ gafee.
16 Ọ ga-esite nʼAsịrịa kpawaa ụzọ
nʼihi ndị ya fọdụrụ nʼebe ahụ,
dịka o si meere ndị Izrel nʼoge gara aga,