1 Ya mere, ụmụnna m dị nsọ, ndị so keta oke nʼọkpụkpọ eluigwe ahụ, ka echiche unu dịgide naanị na Jisọs. Onyeisi ozi na onyeisi nchụaja nke okwukwe anyị. 2 O kwesiri ntụkwasị obi nye onye ahụ họpụtara ya dịka Mosis si bụrụ onye kwesiri ntụkwasị obi nʼije ozi ya nʼụlọ Chineke. 3 Ma Jisọs nwere ugwu na nsọpụrụ karịa Mosis, dịka onye na-ewu ụlọ si enwe ugwu na nsọpụrụ karịa ụlọ o wuru. 4 Nʼihi na ụlọ ọbụla nwere onye wuru ya, maọbụ Chineke na-ewu ihe niile. 5 Mosis kwesiri ntụkwasị obi dịka odibo nʼụlọ Chineke nʼihe niile,[a] sịkwa otu a gbaa ama banyere ihe ndị a ga-ekwu nʼọdịnihu. 6 Ma otu ọ dị, Kraịst kwesiri ntụkwasị obi dịka ọkpara nke na-elekọta ụlọ ya. Anyị gabụkwanụ ụlọ ya ma ọ bụrụ na anyị ejidesie okwukwe anyị ike ya na olileanya nke anyị ji anya isi.
12 Lezienụ anya, ụmụnna m, ka ajọ omume niile na ekweghị ekwe niile nke obi ghara ịdị nʼime onye ọbụla nʼetiti unu, nke ga-eme ka unu site nʼiso Chineke dị ndụ tụgharịa. 13 Kama, na-agbanụ onwe unu ume kwa ụbọchị niile dịka a kpọrọ ụbọchị ahụ Taa. Ka a hapụ inwekwa onye ọbụla a ga-esite nʼaghụghọ nke mmehie mee ka obi ya sie ike. 14 Anyị bụ ndị anyị na Kraịst ga-eso kekọrịta oke ma ọ bụrụ na anyị ga-ejidesi ya ike bụ ntụkwasị obi ahụ anyị nwere site na mmalite ruo ọgwụgwụ. 15 Dị ka e kwuru ya,
16 Olee ndị bụ ndị ahụ nụrụ ma nupu isi? Ọ bụ na ọ bụghị ndị niile ahụ Mosis dupụtara site nʼala Ijipt? 17 Ọ bụkwa olee ndị ka o wesoro iwe iri afọ anọ? Ọ bụ na ọ bụghị ndị ahụ mehiere. Ndị ahụ ahụ ha dara nʼọzara? 18 Olee ndị ahụ ọ ṅụụrụ iyi na ha agaghị aba nʼizuike ya? Ọ bụ na ha abụghị ndị ahụ nupuuru ya isi? 19 Ugbu a, anyị maara na ha enweghị ike ịbanye, nʼihi na ha bụ ndị na-ekweghị ekwe.