6 Ebram zara Serai sị, “Lee, ohu gị nwanyị dị gị nʼaka. Jiri ya mee ihe ọbụla dị gị mma nʼanya.” Nʼihi nke a, Serai mesiri ya ihe ike, nke mere ka o si nʼebe Serai nọ gbapụ.
7 Ma mmụọ ozi Onyenwe anyị hụrụ ya nʼakụkụ isi iyi mmiri dị nʼọzara, nʼakụkụ ụzọ Shua, 8 jụọ ya sị, “Hega, ohu nwanyị Serai, olee ebe i si bịa, olee ebe ka ị na-ejekwa?”
9 Mmụọ ozi Onyenwe anyị gwara ya sị, “Laghachikwuru nne gị ukwu. Doo onwe gị nʼokpuru ya.” 10 Mmụọ ozi Onyenwe anyị sịkwa ya, “Aga m amụba ụmụ gị, ka a hapụ inwe ike ịgụta ole ha dị.”
11 Mmụọ ozi Onyenwe anyị gwakwara ya sị,
13 Hega kpọkuru aha Onyenwe anyị, onye gwara ya okwu sị, “Ị bụ Chineke m na-ahụ m.” Nʼihi na Hega kwuru sị, “Ahụla m, ugbu a, onye ahụ na-ahụ m.” 14 Ọ bụ ya mere e ji na-akpọ olulu mmiri ahụ, Bịa-Lahai-Rọị.†Ma o bụ, Olulu Mmiri nke Onye ahụ dị ndụ na-ahụ m. Ọ ka dị ebe ahụ, nʼetiti Kadesh na Bered.
15 Emesịa, Hega mụtaara Ebram nwa nwoke. Ebram kpọrọ nwa nwoke ahụ Hega mụtaara ya Ishmel. 16 Ebram gbara iri afọ asatọ na isii mgbe Hega mụtaara ya Ishmel.
<- Jenesis 15Jenesis 17 ->- a Amụtaghị nwa bụ ihe ndị mmadụ na-ahụta dị ka ntaramahụhụ si nʼaka Chineke. Ọ bụrụ na nwanyị amụtaghị nwa, nʼebe ụfọdụ, omenaala na-akwado ya ị họtara di ya nwanyị ọzọ, onye ga-amụrụ ya ụmụ. Ụmụ niile nwanyị ahụ ga-amụta na-abụ nke nwanyị ahụ na-amụtaghị nwa. Jen 20:18; 30:3
- b Ma o bụ, Olulu Mmiri nke Onye ahụ dị ndụ na-ahụ m.