7 “ ‘Jikere! Jikere onwe gị, gị onwe gị na usuu ndị agha ahụ nọ gị gburugburu, gị Gog, bụrụkwa onyendu ha. 8 Mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị, a ga-akpọlite gị ibu agha. Nʼogologo oge dị nʼihu, ị ga-ebuso ala ahụ agha bụ ala ahụ na-enwetaghachi onwe ya site na mbibi nke ibu agha; ala ahụ e si na mba dị iche iche chịkọtaa ndị bi nʼime ya, mee ka ha birikwa nʼugwu niile nke Izrel ahụ naara atọgbọ nʼefu. E bulatara ha site na mba dị iche iche, ma ugbu a, ha anọrọla nʼudo. 9 Gị onwe gị, na ndị agha gị niile, na ọtụtụ ndị mba ahụ dị iche iche ndị na-eso gị, jiri ọsọ, dịka ikuku siri ike, rigoo, kpuchie ala ahụ dịka igwe ojii.
10 “ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼụbọchị ahụ, echiche ọjọọ ga-abata nʼobi gị, mgbe ị na-atule ọtụtụ ihe dị iche iche nʼobi gị. 11 Ị ga-asị, “Aga m ebuli megide nʼala na-enweghị mgbidi, aga m awakpo ndị nọ nʼudo na-adịghị atụ anya nsogbu ọbụla, ha niile bụ ndị bi nʼebe na-enweghị mgbidi, ha enweghịkwa ibo ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ha. 12 Aga m akwata ihe nkwata, lụtakwa ihe nlụta nʼagha. Aga m eweli aka m megide obodo ndị a niile e wugharịrị ewugharị, megidekwa ndị a niile e si na mba dị iche iche chịkọtaa, bụ ndị bara ọgaranya nʼanụ ụlọ na ngwongwo dị iche iche, ndị bikwa nʼetiti ala a.” 13 Ndị Sheba na Dedan, na ndị ahịa Tashish niile, na ụmụ ọdụm ya niile ga-ajụ gị, “Ị bịara ịkwata ihe nkwata? Ị chịkọtara usuu ndị agha gị nʼihi ịkwara ihe nlụta, na iburu ọlaọcha na ọlaedo, na ịchịrị igwe anụ ụlọ ha, na ngwongwo ha, na ịkwakọrọ ihe ha nwere nʼike?” ’
17 “ ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ọ bụ gị, bụ onye ahụ m kwuru okwu banyere ya nʼoge gara aga, site nʼọnụ ndị ohu m, bụ ndị amụma Izrel, ndị buru amụma ọtụtụ afọ na mgbe ahụ, sị, na m ga-eme ka ị megide ndị m. 18 Lee ihe ga-eme nʼụbọchị ahụ. Mgbe Gog busoro ala Izrel agha, ọ ga-esi otu a kpalie iwe m dị ọkụ. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. 19 Nʼihi na esitere m nʼịnụ ọkụ nke obi m, na oke iwe m kwupụta sị, na ala ọma jijiji dị ukwuu ga-adị nʼIzrel nʼụbọchị ahụ. 20 Azụ niile dị nʼoke osimiri, na anụ ufe nke eluigwe, na anụ ọhịa, na ihe niile na-akpụ akpụ, na mmadụ niile nọ nʼelu ụwa ga-ama jijiji nʼihu m. A ga-akwatu ugwu niile, ebe niile dị mkputamkpu ga-adarukwa ala. 21 Aga m akpọlite mma agha ka o megide Gog nʼugwu m niile. Onye ọbụla ga-ejikwa mma agha ya megide nwanne ya nwoke. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya. 22 Aga m eji ọrịa na-efe efe na iwusi ọbara kpee ya ikpe. Aga m awụkwasị ya na ndị agha ya na ọtụtụ mba dị iche iche ndị ahụ so ya, oke mmiri ozuzo na akụmmiri, na nkume ọkụ. 23 Otu a ka m ga-esi gosi ịdị ukwuu m, na ịdị nsọ nke aha m. Aga m emekwa ka a mara m nʼanya mba niile dị iche iche. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’
<- Izikiel 37Izikiel 39 ->