6 Mosis na Erọn mere dịka Onyenwe anyị nyere ha iwu. 7 Nʼoge a, mgbe ha gwara Fero okwu, Mosis agbaala iri afọ asatọ. Ma Erọn agbaala iri afọ asatọ na atọ.
10 Mgbe ahụ, Mosis na Erọn jekwuuru Fero mee dịka Onyenwe anyị nyere ha nʼiwu. Erọn tụpụrụ mkpanaka ya nʼala nʼihu Fero na ndị ozi ya. Ọ ghọrọ agwọ. 11 Ma Fero kpọkọtara ndị maara ihe, na ndị mgbaasị, na ndị majiki nọ nʼIjipt. Ha bịara mee ụdị ihe ịrịbama ahụ Mosis na Erọn mere site nʼihe nzuzo nke akaọrụ ha. 12 Onye ọbụla nʼime ha tụpụrụ mkpanaka ya, nke ghọkwara agwọ. Ma mkpanaka ahụ Erọn tụpụrụ, nke ghọrọ agwọ, loro mkpanaka ndị ahụ niile ndị Ijipt tụpụrụ. 13 Fero nyịchiri obi ya, mee ka o sie ike. O geghị Erọn na Mosis ntị dịka Onyenwe anyị kwuru.
19 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Gwa Erọn ka o setịpụ mkpanaka ya nʼelu mmiri niile dị nʼIjipt. Nke a metụtara osimiri ha niile, mmiri ntakịrị ha niile, ọdọ mmiri ha niile, na ebe niile ha na-echekọta mmiri. Ọbara ga-ejupụta ebe niile nʼIjipt, ite mmiri na ite aja na ite osisi niile.”
20 Mosis na Erọn mere dị ka Onyenwe anyị nyere ha nʼiwu ime. Nʼihu Fero na ndịisi ọrụ ya, Erọn weliri mkpanaka ya tie ya nʼelu mmiri dị nʼosimiri Naịl. Nʼotu ntabi anya, mmiri ahụ gbanwere ghọọ ọbara. 21 Ka azụ dị nʼime mmiri Naịl nwụsịrị, mmiri ahụ malitere na-esi isi ọjọọ, nke mere ka ndị Ijipt hapụ inwe ike ịṅụ mmiri sitere na ya. Ọbara jupụtakwara nʼala Ijipt niile.
22 Ma ndị majiki Ijipt jikwa ihe nzuzo ha mee ka mmiri chaa ọbara ọbara.[c] Nke a mere ka Fero nyịchie obi ya. Ọ ṅaghị Mosis na Erọn ntị, dịka Onyenwe anyị gwara ha na ọ ga-eme. 23 Fero tụgharịrị laghachi nʼụlọeze ya, na-echeghị echiche banyere ihe niile ahụ e mere. 24 Ya mere, ndị Ijipt niile gwuru olulu mmiri nʼakụkụ osimiri ahụ ịchọ mmiri ọṅụṅụ ebe ha na-enweghị ike ịṅụ mmiri sitere nʼosimiri Naịl.
- a Nke a pụtara, ga-abụ ọnụ na-ekwuru gị
- b Ndị Fero na-aga nʼosimiri Naịl ụtụtụ ụbọchị niile, nʼihi ikpe ekpere nye chi Naịl, onye ha weere ka nna chi niile. Ya mere, mmadụ ime ihe ọbụla ga-emetụta osimiri Naịl dịka onye ahụ ịmetụ aka na mkpụrụobi ndị Ijipt. Nʼihi na ha kwenyere na ihe ọbụla mee osimiri Naịl, nʼala Ijipt ga-aghọ ọzara.
- c Ihe ịrịbama (ọrịa na-efe efe) niile ndị a dị iche iche gosipụtara ike Chineke nʼebe ihe niile e kere eke dị, karịchasịa nʼebe ihe e kere eke nke ndị mmadụ na-efe dịka chi. Ọ bụ nʼetiti ọnwa mbụ nʼafọ ruo nʼọnwa anọ ka ihe ịrịbama niile ndị ahụ mere.