4 Nụrụ gị Izrel, Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, Onyenwe anyị bụ otu. 5 Were obi gị niile, na mkpụrụobi gị niile, na uche gị na ike gị niile, hụ Onyenwe anyị Chineke gị nʼanya. 6 Iwu ndị a m na-enye gị taa ka ị ga-eme ka ọ dịrị gị nʼobi. 7 Ị ga-akụziri ya ụmụ gị. Kwuo okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ ala nʼụlọ gị, mgbe ị na-aga nʼokporoụzọ, mgbe ị na-edina ala na mgbe i si nʼihe ndina bilie. 8 Keenụ ha dịka ihe ịrịbama nʼelu aka unu, kekwasịkwa ha dịka ihe ncheta nʼegedege ihu unu. 9 Dee ha nʼelu ibo ọnụ ụzọ ụlọ gị na nke ọnụ ụzọ ama gị.
10 Mgbe Onyenwe anyị Chineke ga-akpọbata unu nʼala ahụ ọ ṅụrụ iyi nye nna nna unu ha, bụ Ebraham, na Aịzik, na Jekọb, na inye unu, ala sara mbara nke jupụtara nʼobodo unu na-ewughị, 11 na ụlọ ihe ọma dị iche iche jupụtara nʼime ya nke unu na-azụghị, na olulu mmiri unu na-egwughị nʼonwe unu, na ubi vaịnị na ọtụtụ osisi oliv unu na-amaghị ndị kụrụ ha, mgbe unu riri ihe rijuo afọ, 12 leruonu anya, ka unu ghara ichefu Onyenwe anyị, onye mere ka unu site nʼala Ijipt pụta, bụ ala ebe unu bụ ohu.
13 Onyenwe anyị bụ Chineke gị, ka ị ga-atụ egwu, naanị ya ka ị ga-efe ofufe, ọ bụkwa aha ya ka ị ga-eji ṅụọ iyi. 14 Unu agbasola chi ndị ọzọ, bụ chi ndị niile a gbara unu gburugburu na-efe. 15 Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu, onye nọ nʼetiti unu, bụ Chineke ekworo. Ọ ga-eme ka iwe ya dị ọkụ megide unu, ọ ga-ekpochapụkwa unu site nʼelu ụwa. 16 Anwala Onyenwe anyị, bụ Chineke gị ọnwụnwa, dịka unu nwara ya na Masa. 17 Lezienụ anya hụ na unu debere iwu niile na ụkpụrụ niile, na ihe ama niile Onyenwe anyị Chineke unu nyere unu. 18 Meenụ ihe ziri ezi, na nke dị mma nʼanya Onyenwe anyị, ka ihe niile gaara unu nke ọma, ka unu nweekwa ike ịbanye, ma nweta ezi ala ahụ Onyenwe anyị ji ịṅụ iyi kwee nna nna unu ha na nkwa. 19 Ka unu chụpụkwa ndị iro unu niile site nʼala ahụ, dịka Onyenwe anyị nʼonwe ya kwuru.