7 Mgbe ahụ, Mosis kpọrọ Joshua, gwa ya okwu nʼihu ụmụ Izrel, sị ya, “Dị ike! Nwee obi ike! Nʼihi na ọ bụ gị ga-edu ndị a baa nʼala ahụ Onyenwe anyị ṅụrụ iyi inye nna nna ha, ị ga-emekwa ka ha keta ala a dịka ihe nketa ha. 8 Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-eburu gị ụzọ, ọ ga-anọnyekwara gị, ọ gaghị ahapụ gị maọbụ gbakụta gị azụ. Atụla egwu, adala mba.”
15 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gosiri ha onwe ya nʼime ogidi igwe ojii nke guzochiri ọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. 16 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Ị ga-anwụ, jekwuru nna nna gị ha. Mgbe ị nwụrụ, ndị a ga-amalite ife chi ọzọ ofufe ndị dị nʼala ahụ ha na-abanye. Ha ga-agbakụta m azụ, mebie ọgbụgba ndụ mụ na ha gbara. 17 Nʼụbọchị ahụ, iwe m ga-adị ọkụ megide ha, aga m agbakụta ha azụ, zoo ihu m nʼebe ha nọ. A ga-alakwa ha nʼiyi. Ọdachi na ahụhụ dị iche iche ga-abịakwasị ha, nke ga-eme ka ha sị, ‘Chineke anyị anọkwaghị nʼetiti anyị, ọ bụ ya mere ọdachi ndị a ji bịakwasị anyị.’ 18 Aga m echepụ ihu m site nʼebe ha nọ nʼụbọchị ahụ, nʼihi ajọ omume ha nke ife chi ọzọ ofufe.
19 “Ugbu a, depụtaranụ onwe unu abụ a nʼakwụkwọ, kuziekwara ya ụmụ Izrel, ka ọ bụrụ ihe akaebe m megide ha. 20 Mgbe m mere ka ha bata nʼala ahụ m kwere nna nna ha na nkwa, ala ahụ mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-erugharị nʼime ya, mgbe ha rijukwara afọ, baakwa ụba, ha ga-ebido ife chi ọzọ ofufe, jụ m, ma mebikwaa ọgbụgba ndụ m. 21 Ma mgbe ọtụtụ ihe ọdachi na ahụhụ ga-abịakwasị ha, abụ a ga-eme ka ha cheta ihe mere nsogbu ha niile ji bịakwasị ha, nʼihi na abụ a ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Amaara m nke ọma ugbu a, ọ bụladị tupu ha abanye nʼala ahụ m kwere nkwa inye ha site nʼịṅụ iyi, ụdị mmadụ ha bụ.” 22 Ya mere, nʼụbọchị ahụ, Mosis dere abụ ahụ, kuziekwara ya ụmụ Izrel.
23 Mgbe ahụ Onyenwe anyị nyere Joshua nwa Nun iwu sị ya, “Dị ike, nwee obi ike, ị ghaghị ịkpọbata ụmụ Izrel nʼala ahụ m sitere nʼịṅụ iyi kwee ha na nkwa. Mụ onwe m ga-anọnyere gị.”
24 Mgbe Mosis dechara okwu niile nke iwu ndị a nʼakwụkwọ, site na mbido ruo nʼọgwụgwụ, 25 o nyere ndị Livayị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị iwu sị ha, 26 “Werenụ Akwụkwọ Iwu a tinye ya nʼakụkụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke unu, ka ọ bụrụ ihe ịgba ama megide unu. 27 Nʼihi na amaara m na unu bụ ndị nnupu isi, na ndị isiike. Lee, ọ bụladị taa m nọ ndụ nʼetiti unu, unu na-enupu isi nʼebe Onyenwe anyị nọ, unu ga-esi aṅaa ghara inupu isi mgbe m nwụrụ? 28 Kpọkọtaanụ ndị okenye unu niile, na ndị ọchịchị agbụrụ unu niile, ka m kwupụta okwu ndị a mgbe ha na-anụ ya. Ka m kpọkuokwa eluigwe na ụwa ka ha gbaa ama megide ha. 29 Nʼihi na amaara m na mgbe m nwụrụ, unu ga-aghọ ndị rụrụ arụ nke ukwuu, unu ga-ewezuga onwe unu site nʼebe iwu ndị ahụ m nyere unu dị. Amakwaara m na nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa, ihe ọjọọ ga-adakwasị unu, nʼihi ihe ọjọọ niile unu mere nʼihu Onyenwe anyị nke unu ji kpasuo ya iwe site nʼihe ndị ahụ unu ji aka unu kpụọ.”
- a Ọ bụ naanị na mmemme nke a, ka a na-akpọkọta ndị inyom na ụmụntakịrị, ka ha bịa nụrụ ihe a na-agụpụta site nʼakwụkwọ iwu ahụ.