15 Lee, edoola m nʼihu gị taa ndụ na ọganihu, ọnwụ na ịla nʼiyi. 16 Enyela m gị iwu taa, sị gị hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya, ana m asịkwa gị gbasoo ụzọ ya, ma debekwa iwu na ụkpụrụ ya niile, ka ị dịrị ndụ, ghọọkwa mba buru ibu, ka Onyenwe anyị bụ Chineke gị gọzie gị nʼala ahụ ị na-aga inweta.
17 Ma ọ bụrụ na obi gị e si nʼiso ya tụgharịa, ọ bụrụkwa na ị jụ ige ntị, ọ bụrụ na a dọkpụfuo gị mee ka i fee chi ndị ọzọ ofufe ma ịkpọ isiala nye ha, 18 agwala m gị hoohaa taa, na ị ga-ala nʼiyi, ị gaghị enwe ogologo ndụ nʼala ahụ ị na-agafe osimiri Jọdan inweta.
19 Ana m akpọku eluigwe na ụwa[a] taa ka ha bụrụ ndị akaebe m, na edebela m nʼihu gị ọnwụ na ndụ, debekwa nʼihu gị ngọzị na ọbụbụ ọnụ. Ugbu a, họrọ ndụ, ka gị na ụmụ gị dị ndụ 20 ka ị hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya, ṅaa ntị nʼolu ya, daberekwa na ya. Nʼihi na Onyenwe anyị bụ ndụ gị, ọ ga-enye gị ụbọchị ndụ gị niile nʼala ahụ o kwere nkwa ị nye nna nna gị ha Ebraham, na Aịzik, na Jekọb.
<- Diuteronomi 29Diuteronomi 31 ->- a Dit 4:26; 8:19