3 Erila ihe ọbụla m kwuru na ọ bụ ihe rụrụ arụ. 4 Ndị a bụ anụmanụ unu ga-eri: ehi, atụrụ, na ewu, 5 na ele nta, na mgbada, na atụrụ ọhịa, na ewu ọhịa, ele ukwu, na anịgọ bi nʼelu ugwu. 6 Anụmanụ ọbụla ụkwụ ya wara njakpa, nke na-atagharị ọnụ ka unu ga-eri. 7 Ma otu ọ dị, nʼetiti anụ ndị ahụ na-atagharị nri maọbụ ndị ụkwụ ha wara njakpa, ndị a ka unu na-agaghị eri, ịnyịnya kamel, na ewi maọbụ ewi nkume, na anụ ndị ọzọ yiri ha, ọ bụ ezie na ha na-atagharị ọnụ, ma ha enweghị ụkwụ wara njakpa. Ha bụ ihe na-adịghị ọcha nye unu. 8 Ezi bụkwa anụ na-adịghị ọcha; ọ bụ ezie na o nwere ụkwụ wara njakpa, ma ọ dịghị atagharị nri. Unu agaghị emetụla ozu ha aka maọbụ rie anụ ha.
9 Nʼime ihe niile e kere eke, dị ndụ, biri na mmiri, unu nwere ike iri nke ọbụla nwere ntu na akpịrịkpa, 10 ma ihe ọbụla nke na-enweghị ntu na akpịrịkpa, unu erila ha, nʼihi na ha rụrụ arụ.
11 Unu ga-eri nnụnụ ọbụla dị ọcha, 12 ma unu agaghị eri ndị a: ugo, na udele, na udele ojii, 13 na ndagbụ, na ọgankwọ, na ndagbụ dị iche iche, 14 na ugolọma ọbụla dị iche iche, 15 na enyi nnụnụ, na egbe abalị, na nnụnụ oke osimiri, na egbe dị iche iche, 16 na okwukwu nta, na okwukwu ukwu, na okwukwu nwere mpi, 17 na okwolo na udele, na komorant, 18 na ụgbala, na utù dị iche iche, na nnụnụ ọdụ nta, na ụsụ.
19 Ụmụ ahụhụ niile na-efe efe rụrụ arụ nye unu, unu erila ha, 20 Ma unu nwere ike iri ụmụ ahụhụ ndị ahụ nwere nku, ndị dị ọcha.
21 Unu erila anụ ọbụla nwụrụ anwụ. Ma otu o si dị, onye ọbịa nʼetiti unu nwere ike rie ya. I nwere ike inye ya, maọbụ resi ya onye ahụ, ma erila ya, nʼihi na onye dị nsọ nye Onyenwe anyị Chineke gị ka ị bụ.
28 Nʼọgwụgwụ afọ atọ ọbụla, ị ga-eweta otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe ubi gị, chịkọta ha nʼebe a ga-echebe ha nʼobodo gị, 29 ka ndị Livayị, ndị na-enweghị ihe nketa nʼetiti gị, na ndị ọbịa, na ndị inyom di ha nwụrụ anwụ, na ụmụ mgbei niile nọ nʼobodo gị, bịa nʼebe ahụ were nri ha ga-eri, rijuokwa afọ. Nʼụzọ dị otu a, Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzi gị, gọziekwa ọrụ aka gị niile.
<- Diuteronomi 13Diuteronomi 15 ->- a Ihe ndị a bụ usoro mmemme iru ụjụ nke ndị na-eme omenaala. Lev 19:27-28