3 Nʼechi ya, anyị rutere Saịdọn. Juliọs nwere obiọma nʼebe Pọl nọ. Ọ hapụkwara ya ka o jegharịara onwe ya izute ndị enyi ya. Ndị a lekwara anyị ọbịa nke ọma. 4 Nʼịgakwa nʼihu na mmiri ahụ, anyị zutere ifufe mmiri nke mere na anyị gara nʼazụ ala Saiprọs. 5 Anyị gafere ọnụ mmiri obodo Silisia na Pamfilia. Anyị bịaruru Mira nʼime obodo Lisia. 6 Nʼebe ahụ ka onye ọchịagha hụrụ ụgbọ onye Alegzandria nke na-aga Itali. O mere ka anyị banye nʼime ya. 7 Ụgbọ anyị ji, gara nwayọọ ọtụtụ ụbọchị na o siiri anyị ike irute Snidos. Ebe ọ bụ nʼoke ifufe ekweghị ka anyị gaa nʼihu, anyị enwekwaghị ike ịga nʼụzọ anyị, kama anyị si nʼazụ Kriit na ncherita ihu Salmone gafee. 8 Anyị jikwa nwayọọ na-agba nʼakụkụ ọnụ mmiri ahụ tutu ruo mgbe anyị sitere nʼoke nsogbu rute ebe a na-akpọ ọnụ mmiri ọma, nke dị nso nʼobodo Lasia.
9 Anyị tufuru oge nʼebe ahụ. Ije ụgbọ mmiri abụrụkwala nke jupụtakwara nʼihe ize ndụ ugbu a, nʼihi na mmemme Obubu ọnụ nke ndị Juu agafeela. Nʼihi nke a, Pọl dụrụ mmadụ niile ọdụ, 10 na-asị, “Ndị nwe m, a na m ahụta na njem a ga-abụ nke ihe egwu nke ga-eweta oke ịla nʼiyi. Ọ bụghị naanị nke ụgbọ mmiri na ibu o bu, ma metụtakwa ndụ anyị.” 11 Ma ọchịagha ahụ kwenyere nʼihe onyeisi ụgbọ na onye nwe ụgbọ kwuru karịa nke Pọl kwuru. 12 Ma ebe ọnụ mmiri a abụghị ebe dị mma ịnọ nʼoge oyi, ndị ka nʼọnụọgụgụ họọrọ ka ụgbọ ahụ gaa nʼihu, nʼolileanya na a ga-eru Fonikisi ebe ha ga-anọdụ nʼoge oyi. Nke a bụ ọnụ mmiri dị na Kriit, nke chere ihu nʼọwụwa anyanwụ nʼakụkụ ugwu na akụkụ ndịda.
21 Nʼoge a niile, o nweghị onye ọbụla nri ọbụla bara ọnụ. Ma nʼikpeazụ. Pọl kwụụrụ ọtọ nʼetiti ha sị, “Ndị ikom ibe m, ọ bụrụ na unu gere ntị nʼokwu m na mbụ, anyị agaraghị ahapụ Kriit. Anyị gara agbanarị mbibi na ịla nʼiyi nke a. 22 Ma otu ọ dị, ana m arịọ unu, nweenụ obi ike! Nʼihi na o nweghị onye ọbụla nʼime unu a ga-atụfu ndụ ya. Ọ bụ ezie na ụgbọ a ga-emikpu. 23 Nʼihi na nʼabalị gara aga, mmụọ ozi Chineke Onyenwe m, na onye m na-efekwa bịakwutere m, 24 ọ sịrị, ‘Atụla egwu Pọl, nʼihi na ị ghaghị iguzo nʼihu Siza. Nke ọzọkwa, Chineke emeela amara nye gị ndụ ndị a niile gị na ha so nʼụgbọ eme njem.’ 25 Ya mere, ndị ikom nweenụ obi ike! Nʼihi na enwere m ntụkwasị obi na Chineke ga-eme dị ka o siri gwa m. 26 Ma otu ọ dị, a ga-eburu ụgbọ mmiri anyị buba ya nʼotu agwa etiti.”
33 Mgbe chi bidoro ịbọ, Pọl rịọrọ mmadụ niile ka ha rie nri, na-asị, “Taa mere ya ụbọchị iri na anọ unu nọ na nche, nọgidekwa nʼibu ọnụ, nʼerighị ihe ọbụla. 34 Nʼihi ọdịmma nke ndụ unu, ana m arịọ unu ka unu rie ihe. Nʼihi na o nweghị onye ọbụla nʼime unu otu agịrị isi ya ga-ala nʼiyi.” 35 Mgbe o kwuchara nke a, o weere achịcha nye Chineke ekele nʼihu ha niile, nyawaa ya, malitekwa iri ya. 36 Otu mgbe ahụ, obi ụtọ batara mmadụ niile nʼobi, ha bidokwara iri nri. 37 Anyị niile nọ nʼụgbọ ahụ dị narị mmadụ abụọ na iri asaa na isii. 38 Mgbe anyị richara nri, ha buuru akpa ọka niile dị nʼụgbọ ahụ tụba ha nʼime osimiri ime ka ụgbọ ahụ gbaa mfe.
42 Ndị agha zubere igbu ndị mkpọrọ niile, ka onye ọbụla ghara igwuru mmiri site ya gbafuo.[a] 43 Ma onye ọchịagha ahụ na-ezube ịzọpụta ndụ Pọl, nʼihi ya, o gbochiri ha nʼizuzu ha. Mgbe ahụ o nyere iwu ka ndị niile maara igwu mmiri buru ụzọ si nʼụgbọ ahụ wụba nʼime mmiri, gwuru mmiri gaa nʼelu ala. 44 Ma ndị fọdụrụ ga-eru nʼelu ala site nʼịghọnye aka na obodobo osisi maọbụ nʼihe ndị ọzọ dị iche iche si nʼahụ ụgbọ ahụ dapụta. Nʼụzọ dị otu ka mmadụ niile ji bụrụ ndị rutere nʼelu ala nʼudo.
<- Ọrụ Ndị Ozi 26Ọrụ Ndị Ozi 28 ->- a Ọ bụrụ na ndị mkpọrọ a gbafuo, a na-egbu ndị agha niile ọ bụ ọrụ ha iledo ha.