4 Mgbe nwanyị ahụ si Tekoa gara na nke eze, ọ dara nʼala kpuo ihu ya nʼala ịsọpụrụ eze. Ọ sịrị, “Biko nyere m aka, gị onye a na-asọpụrụ!”
5 Eze jụrụ ya ajụjụ sị, “Gịnị bụ mkpa gị?”
8 Eze sịrị nwanyị ahụ, “Laa nʼụlọ gị, aga m ahụ na o nweghị onye metụrụ ya aka.”
9 Ma nwanyị ahụ si Tekoa sịrị ya, “Ka onyenwe m, bụ eze, gbaghara mụ na ezinaụlọ m, ka ikpe ọmụma ọbụla ghara ịdịrị eze na ocheeze ya.”
10 Eze zara ya, “Enyela onwe gị nsogbu maka nke ahụ. Ọ bụrụ na onye ọbụla agwa gị okwu ọbụla, kpọtara m ya. Onye dị otu a agaghị enyekwa gị nsogbu ọzọ.”
11 Mgbe ahụ ọ zara, “Biko, ka eze kpọkuo aha Onyenwe anyị Chineke ya ka ọ kwụsị onye na-agwa ọchụ, ka ọ ghara igbu onye ọzọ, ka a gharakwa ịla nwa m nwoke nʼiyi.”
12 Mgbe ahụ, nwanyị ahụ sịrị, “Biko kwere ka ohu gị nwanyị gwa onyenwe m eze otu mkpụrụ okwu ọzọ.”
13 Nwanyị ahụ sịrị, “Ọ bụ nʼihi gịnị ka ị chere ihe dị otu a megide ndị nke Chineke? Mgbe eze na-ekwu otu a, ọ bụ na ọ dịghị ama onwe ya ikpe, nʼihi na eze a jụla ịkpọghachi nwa ya a chụpụrụ achụpụ? 14 Anyị niile ga-anwụ. Anyị dịkwa ka mmiri a wụsara nʼala, nke a na-apụghị ịchịkọtakwa ọzọ. Ma Chineke adịghị anapụ mmadụ ndụ ya, ma ọ na-emeghepụ ụzọ ga-eme ka onye ọ chụpụrụ achụpụ lọghachikwutekwa ya.
15 “Ma ugbu a, ebe m bịara ịgwa onyenwe m bụ eze, okwu a, nʼihi na ndị mmadụ emenyela m egwu. Ohu gị chere nʼobi ya, ‘Aga m agwa eze okwu; ma eleghị anya, ọ ga-emezuru ohu ya nwanyị ihe ọ rịọrọ. 16 Ma eleghị anya eze ga-anapụta ohu ya nwanyị site nʼaka nwoke ahụ na-agbalị ibipụ mụ na nwa m nwoke site nʼihe nketa nke Chineke.’
17 “Ugbu a, ohu gị nwanyị na-asị, ‘Ka okwu onyenwe m eze kwuru wetara m izuike, nʼihi onyenwe m eze na-enyochapụta ihe ọma maọbụ ihe ọjọọ dịka mmụọ ozi Chineke. Ka Onyenwe anyị Chineke gị nọnyere gị.’ ”
18 Mgbe ahụ, eze gwara nwanyị ahụ okwu sị, “Achọrọ m ka ị gwa m eziokwu nʼajụjụ a m na-aga ịjụ gị.”
19 Devid jụrụ ya sị, “Aka Joab ọ dị nʼokwu ndị a niile?”
21 Eze sịrị Joab, “Ọ dị mma, aga m eme ya. Gaa kpọghachite nwokorobịa ahụ bụ Absalọm.”
22 Joab dara nʼala kpuo ihu ya nʼala, kpọọ isiala, gọzie eze. Joab sịrị, “Taa ka ohu gị maara na ahụtala m amara nʼihu gị, onyenwe m bụ eze, nʼihi na eze e merela ohu ya ihe ọ rịọrọ.”
23 Joab biliri gaa Geshua, kpọlata Absalọm na Jerusalem. 24 Mgbe ha bịaruru, eze gwara Joab okwu sị, “Gwa ya ka ọ laa nʼụlọ ya. Ọ gaghị abịa nʼihu m, nʼihi na-achọghị m ịhụ ya anya.” Ya mere, Absalọm lara nʼụlọ ya. Ọ hụkwaghị eze anya.
25 Ọ dịghị nwoke mara mma dịka Absalọm nʼala Izrel niile. Ọ dịkwaghị onye na-adịghị ekwu okwu banyere ịma mma ya. Nʼihi na ntụpọ ọbụla adịghị ya nʼahụ site nʼopi isi ya ruo nʼọbọ ụkwụ ya. 26 Mgbe ọbụla ọ kpụchara ntutu isi ya, nʼihi na ọ bụ otu ugboro nʼafọ ka ọ na-akpụcha agịrị isi mgbe o bidoro ịnyị ya arọ. Ọ na-atụ agịrị isi a na-akpụchapụta ya nʼisi, ịdị arọ ya na-eru narị shekel abụọ†Nke a bụ kilo abụọ na ụma atọ ma a tụọ ya nʼihe ọtụtụ eze.
27 Absalọm mụtara ụmụ ndị ikom atọ, na otu nwanyị, aha ya bụ Tama. Nwaagbọghọ a mara mma nke ukwuu.
28 Mgbe Absalọm nọrọ afọ abụọ na Jerusalem na-ahụghị eze anya, 29 o ziri ozi ka Joab bịa, ka ọ gaa ziere ya eze ozi, ma Joab abịaghị. Absalọm zigakwara ozi ọzọ ka ọ bịa ma Joab ekweghị ịbịa. 30 Nʼikpeazụ, Absalọm gwara ndị na-ejere ya ozi okwu sị ha, “Gaanụ sunye ubi ọka balị Joab dị nʼakụkụ nke m ọkụ.” Ha mekwara dịka a gwara ha.
31 Mgbe ahụ, Joab biliri jee nʼụlọ Absalọm, ma sị ya, “Gịnị mere ndị na-ejere gị ozi ji gbaa ubi m ọkụ?”
32 Absalọm sịrị ya, “Lee ezitere m gị ozi, sị, ‘Bịa nʼebe a ka m ziga gị na nke eze ka ị jụta, “Nʼihi gịnị ka m ji site na Geshua lọghachita? Ọ gara a kara m mma ma a sị na m nọ nʼebe ahụ ruo ugbu a.” ’ Ugbu a, achọrọ m ka mụ hụ ihu eze, ọ bụrụ na onwe ajọ omume dị nʼime m, ya mee ka m nwụọ.”
33 Joab gakwuru eze, gwa ya ihe Absalọm kwuru. Mgbe ahụ, eze kpọrọ Absalọm, onye batara ma kpọọ isiala nʼihu eze. Eze sutukwara ya ọnụ.
<- 2 Samuel 132 Samuel 15 ->