1 Mgbe Sọl nwụsịrị, Devid si ebe ọ gara tigbuo ndị Amalek lọghachi. Devid nọrọ ụbọchị abụọ na Ziklag. 2 O ruo, nʼụbọchị nke atọ, otu nwoke si nʼọmụma ụlọ ikwu Sọl bịakwutere ya. Uwe nwoke a yi nʼahụ dọwara adọwa. Isi ya dịkwa aja aja. Ọ batara daa nʼala nʼihu Devid nʼọnọdụ inye ya nsọpụrụ.
3 Devid jụrụ ya sị, “Ebee ka i si bịa?”
Nwoke ahụ zara sị, “Esi m nʼọmụma ụlọ ikwu ndị Izrel gbapụta.”
4 Devid jụrụ ya sị, “Gịnị mere? Biko gwa m.”
Nwoke ahụ zara sị, “Ndị agha Izrel niile agbaala ọsọ. Ọtụtụ nʼime ndị agha Izrel anwụọkwala. Sọl na Jonatan nwa ya nwụkwara!”
5 Devid jụrụ ya sị, “Olee otu i si mata na Sọl na Jonatan anwụọla?”
6 Nwokorobịa ahụ sịrị ya, “Ọ dapụtara na m nọ nʼugwu Gilboa hụ Sọl mgbe ọ dabeere nʼùbe ya. Mgbe ahụ ụgbọ agha ndị iro na ndị na-agba ịnyịnya agha na-esosi ya ike. 7 Mgbe ọ hụrụ m, ọ kpọrọ m ka m bịakwute ya. Azara m ya sị, ‘Gịnị ka m nwere ike ime?’
8 “Ọ jụrụ m sị, ‘Ị bụ onye?’
“Azara m ya sị, ‘Abụ m onye Amalek.’
9 “Ọ sị m, ‘Biko, bịa guzo nʼakụkụ m ka ị gbuo m, nʼihi na ọ bụ ezie na m dị ndụ, ma anọ m nnọọ nʼoke ihe mgbu nke ọnwụ.’
10 “Ya mere, eguzoro m nʼakụkụ ya, gbuo ya, nʼihi na amaara m na ọ gaghị adị ndụ tee anya. Ọ bụkwa mgbe m gbusịrị ya ka m kpupụrụ ya okpueze dị ya nʼisi, gbapụtakwa ya mgbaaka dị nʼogwe aka ya, chịrị ha, ka m chịtara gị ha, onyenwe m.”
11 Mgbe Devid na ndị ikom ya nụrụ ihe ndị a. Ha dọwara uwe ha. 12 Ha ruru ụjụ. Kwaa akwa. Bukwaa ọnụ ruo oge anyasị nʼihi Sọl na Jonatan nwa ya nwoke, na nʼihi ndị agha Onyenwe anyị na ụlọ Izrel. Nʼihi na ha dara site na mma agha.
13 Mgbe ahụ, Devid jụrụ nwokorobịa ahụ wetara ozi ahụ ajụjụ sị, “Olee ebe i si bịa?”
Ọ zara sị ya, “Abụ m onye ọbịa, onye Amalek.”
14 Devid jụrụ ya sị, “Gịnị mere i ji setịpụ aka gị, na-atụghị ụjọ, tigbuo onye Onyenwe anyị tere mmanụ?”
15 Devid kpọrọ otu nʼime ndị ikom ya sị ya, “Gbuo ya!” Nwoke ahụ weere mma agha gbuo ya. 16 Mgbe ahụ Devid sịrị ya, “Ọbara gị laa gị nʼisi, nʼihi na ị ji ọnụ gị kwupụta sị, ‘Egburu m onye Onyenwe anyị tere mmanụ.’ ”
Abụ akwa Devid maka Sọl na Jonatan
17 Emesịa, Devid depụtara abụ akwa a nʼihi Sọl na Jonatan. 18 O nyere iwu ka akụziere ndị Juda, abụ ùta a. E dere ya nʼime akwụkwọ Jesha.
19 “Ebube gị, gị Izrel, abụrụla ihe e gburu nʼebe gị niile dị elu.
dỌ bụ akpụkpọ anụ a mịkpọrọ amịkpọ, nke e tere mmanụ ka e ji eme ọta. Ọ bụ mmanụ ahụ e teere ya, na-eme ka ọ ghara ịma ebu, meekwa ka ọ na-amị amị, i ji gbochie ka àkụ a gbara ghara imife nʼọta ahụ. Ma ọta ndị a, nʼihi na ha amịjuola ọbara nʼebe ọ dị ukwuu, ha adịghị abakwa uru ọta na-aba nʼoge agha.