1 Nʼoge Jehoiakim na-achị, Nebukadneza eze Babilọn ji ike bata nʼala ya, mee ka Jehoiakim ghọọ ohu ya afọ atọ. Ma o mesịrị tụgharịa megide Nebukadneza, nupukwa isi nʼokpuru ya. 2 Onyenwe anyị zigara ndị na-apụnara mmadụ ihe site na Kaldịa, Aram, Moab na ndị Amọn, ka ha ga bibie Juda. Ọ bụ nʼusoro okwu Onyenwe anyị kpọsara site nʼọnụ ndị amụma ya. 3 Nʼezie, ihe ndị a bịakwasịrị Juda dịka Onyenwe anyị si nye ya nʼiwu, ka o si otu a kpochapụ ha site nʼihu ya nʼihi mmehie niile Manase mere, na dịka ihe niile o mere si dị, 4 tinyere ọbara ndị aka ha dị ọcha nke ọ wusiri. Nʼihi na o mere ka ọbara ndị aka ha dị ọcha jupụta na Jerusalem. Onyenwe anyị ekwekwaghị agbaghara ajọ omume dị otu a.
5 Akụkọ ọzọ niile gbasara ọchịchị Jehoiakim na ihe niile o mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe e mere nʼụbọchị ndụ ndị eze Juda? 6 Jehoiakim sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ. Jehoiakin nwa ya ghọrọ eze ọhụrụ nʼọnọdụ ya.
7 Ma eze Ijipt esiteghị nʼala ya pụta ọzọ, nʼihi na eze Babilọn nọchiri oke ala ya niile, site na mmiri iyi Ijipt ruo nʼoke Osimiri Yufretis.
10 Nʼoge ọ bụ eze, ndịisi Nebukadneza, eze Babilọn bịara, gbaa Jerusalem gburugburu ma nọchibido obodo ahụ nʼagha. 11 Nebukadneza, eze Babilọn nʼonwe ya, bịara nʼobodo ahụ mgbe ndị agha ya gbara ya gburugburu. 12 Jehoiakin, bụ eze Juda, na nne ya na ndị ọrụ ya niile na ndịisi niile na ndịisi ozi ya niile were onwe ha nyefee Nebukadneza nʼaka.
15 Nebukadneza kpụụrụ Jehoiakin ka ọ ga biri na Babilọn. O sikwa na Jerusalem kpọrọ nne eze, na ndị nwunye eze, ndị ozi ya, na ndị niile a ma ama nʼala ahụ gaa Babilọn. 16 Eze Babilọn bupụkwara ndị ikom niile dị ike ma tozukwaa ibu agha, ndị ọnụọgụgụ ha dị puku asaa, tinyere otu puku ndị ọrụ aka, na ndị ọrụ ǹka, bulaa ha Babilọn. 17 O mere nwanne nna Jehoiakin, bụ Matanaya, eze nʼọnọdụ ya. Ọ gụgharịrị ya aha, kpọọ ya Zedekaya.