7 O were chi Ashera a pịrị apị, bụ nke o mere, debe nʼime ụlọnsọ ahụ, nke Onyenwe anyị gwara Devid na nwa ya Solomọn okwu, sị, “Nʼụlọnsọ a na nʼime Jerusalem, nke mụ onwe m họpụtara site nʼebo niile nke Izrel, ka m ga-akpọkwasị Aha m ruo mgbe ebighị ebi. 8 Ma agaghị emekwa ka ụkwụ ndị Izrel wagharịa ọzọ site nʼala ahụ nke m nyere ndị nna nna ha, naanị ma ọ bụrụ na ha elezie anya debe ihe niile m nyere ha nʼiwu ma debekwa iwu niile nke ohu m bụ Mosis nyere ha.” 9 Ma ha egeghị ntị, Manase duhiere ha, mee ka ha mee ihe dị njọ karịa nke ndị mba niile ndị Onyenwe anyị lara nʼiyi site nʼihu ndị Izrel.
10 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kwuru okwu site nʼọnụ ndị amụma ya, sị, 11 “Nʼihi na Manase, eze Juda emeela ihe arụ ndị a, o meela ihe dị njọ karịa nke ndị Amọrait,[c] bụ ndị bụ ya ụzọ, o werela arụsị ya duba Juda nʼime mmehie. 12 Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, sịrị: Lee, ana m aga iweta mbibi dị ukwuu nke ga-adakwasị Jerusalem na Juda, nke ntị ọbụla nụrụ ya ga-azụ wuruwuru. 13 Aga m esetipụ eriri ịtụ ọtụtụ nke m ji megide Sameria na ihe ịtụ mgbidi nke m ji megide ụlọ Ehab, nʼelu Jerusalem. Aga m ehichapụ Jerusalem dịka mmadụ si ehichapụ efere, hichaa ya ihu na azụ ma kpuo ya ihu nʼala. 14 Aga m agbakụtakwa ndị fọdụrụ nʼihe nketa m azụ, were ha nyefee nʼaka ndị iro ha. Ha ga-aghọ ihe anaara nʼike, ghọọkwa ihe nkwata nʼagha nye ndị iro ha niile, 15 nʼihi na ha emeela ihe dị njọ nʼanya m, kpasukwaa m iwe, site nʼụbọchị nna nna ha si Ijipt pụta ọbụladị ruo taa.”
16 Nke ka nke, Manase gbukwara ọtụtụ ndị aka ha dị ọcha, ruo na ọ wụsaara ọbara ha site nʼotu akụkụ Jerusalem ruo nʼakụkụ nke ọzọ ya, nke a agụnyeghị mmehie ahụ nke o dubara ndị Juda ime, nke mere ka ha mee ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị.
17 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Manase na ihe niile o mere, tinyere mmehie niile nke o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda? 18 Manase soro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼime ubi a gbara ogige nʼụlọeze ya, bụ ubi Ụza a gbara ogige. Amọn nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
23 Ndị na-ejere Amọn ozi gbara izu megide ya, ha gburu eze nʼime ụlọeze ya. 24 Mgbe ahụ, ndị ala ahụ gburu ndị niile ahụ gbara izu megide eze Amọn. Ha mere Josaya nwa ya nwoke eze nʼọnọdụ ya.
25 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Amọn na ihe ndị o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda? 26 E liri ya nʼili nke aka ya, dị nʼogige Ụza. Josaya nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
<- 2 Ndị Eze 202 Ndị Eze 22 ->