3 Nʼebe ahụ, ụmụ okorobịa ndị amụma nọ na Betel pụtara zute ha abụọ. Ndị amụma ahụ bịakwutere Ịlaisha sị ya, “Ị maara na Onyenwe anyị ga-esi nʼebe ị nọ wepụ onyenwe gị Ịlaịja taa?”
4 Mgbe ahụ, Ịlaịja sịrị ya, “Ịlaisha, nọdụ nʼebe a, nʼihi na Onyenwe anyị ziri m ozi ka m gaa Jeriko.”
5 Ndị otu ndị amụma nọ na Jeriko bịakwutere Ịlaisha nso jụọ ya, “Ị maara na Onyenwe anyị ga-ewepụ onyenwe gị taa?”
6 Mgbe ahụ, Ịlaịja sịrị ya, “Nọdụ nʼebe a, nʼihi na Onyenwe anyị ziri m ka m jee Jọdan.”
7 Iri ndị amụma ise sitere nʼetiti ndị amụma sooro ha guzoro nʼebe dị anya na ncherita ihu ebe Ịlaịja na Ịlaisha kwụsịrị nʼakụkụ Jọdan. 8 Mgbe ahụ, Ịlaịja chịịrị uwe mwụda ya, pịakọtaa ya, tie ya nʼelu osimiri ahụ. Mmiri ahụ kewara ụzọ abụọ, ala akọrọ pụtakwara. Nʼebe ahụ ka Ịlaịja na Ịlaisha si gafee nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ.
9 Mgbe ha abụọ gafesịrị, Ịlaịja jụrụ Ịlaisha ajụjụ sị ya, “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị tupu e site nʼebe ị nọ wepụ m?”
10 Ịlaịja zara sị ya, “Ihe ị rịọrọ bụ ihe sịrị ike omume. Ọ bụrụ na ị hụ m mgbe a na-ewepụ m site nʼebe ị nọ, ị ga-enweta ihe ị rịọrọ. Ma ọ bụrụ na ị hụghị m, ị gaghị enweta ihe ị rịọrọ.”
11 Mgbe ha na-aga nʼihu nʼije ha na-akparịta ụka, na mberede, ụgbọ ọkụ nke ịnyịnya ọkụ na-adọkpụ pụtara ihe kewaa ha abụọ. Mgbe ahụ kwa oke ifufe buuru Ịlaịja rigoro nʼeluigwe. 12 Ịlaisha hụrụ ya, lelie anya elu tie mkpu akwa sị, “Nna m! Nna m! Usuu ụgbọ agha na usuu ndị na-agba ịnyịnya Izrel!” Ọ hụkwaghị Ịlaịja anya ọzọ. O jidere uwe o yi nʼahụ dọwaa ya ibe abụọ.
13 Emesịa, ọ chịlịri uwe mwụda Ịlaịja nke dapụrụ mgbe e weliri ya elu, laghachi bịa guzo nʼakụkụ osimiri Jọdan. 14 O tiri akwa ahụ[b] nʼelu mmiri ahụ jụọ sị, “Olee ebe Onyenwe anyị, Chineke Ịlaịja nọ?” Mgbe o tiri mmiri ahụ ihe, o kewakwara otu ụzọ nʼaka nri nke ọzọ nʼaka ekpe, Ịlaisha gafere nʼofe nke ọzọ.
15 Mgbe ndị amụma ahụ si Jeriko nʼele anya, hụrụ ihe mere, ha sịrị, “Mmụọ Ịlaịja adakwasịla Ịlaisha.” Ha gara zute ya, kpọọ isiala nʼihu ya. 16 Ha sịrị ya “Lee, anyị bụ ndị ohu gị nwere iri ndị ikom ise ahụ siri ike. Kwere ka ha ga chọgharịa nna gị ukwu. Ma eleghị anya mmụọ Onyenwe anyị eburula ya tụdakwa ya nʼotu ugwu, maọbụ nʼotu ndagwurugwu.”
17 Ma mgbe ha nọgidere rịọsie ya arịrịọ ike, ruo mgbe o nwekwaghị ike igbochi ha. Ọ gwara ha sị, “Ọ dị mma, ziganụ mmadụ ka ha gaa chọọ ya.” Ha zigara iri ndị ikom ise, ndị gara chọgharịa Ịlaịja ụbọchị atọ, ma ha achọtaghị ya. 18 Ịlaisha nọ na Jeriko mgbe ndị a lọghachiri bịa kọọrọ ya otu ha si gaa. Mgbe ahụ, ọ gwara ha sị, “Ọ bụ na m agwaghị unu sị unu ejela?”
20 Ịlaisha zara sị ha, “Ọ dị mma, gaanụ tinye nnu nʼime efere ọhụrụ wetara m ya.” Ha gara weta efere ọhụrụ nke nnu juru nʼime ya.
21 Ịlaisha buuru nnu ahụ gaa nʼebe mmiri ahụ si asọpụta, wụnye nnu ahụ nʼime ya. Mgbe ọ na-eme nke a, o kwuru okwu sị, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Agwọọla m mmiri a. Ọnwụ maọbụ amịghị mkpụrụ nke ala agaghị adịkwa.’ ” 22 Site nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, mmiri ahụ dịịrị ọcha ruo taa, dịka Ịlaisha kwuru.