5 Onyenwe anyị tiri eze ihe otiti ọrịa ekpenta ruo ụbọchị ọnwụ ya.[b] O biri nʼụlọ ewupụrụ iche. Jotam[c] nwa nwoke eze ghọrọ onye nlekọta ụlọeze na-achịkwa ndị ala ahụ.
6 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Azaraya, na ihe niile o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda? 7 Azaraya soro ndị nna nna ya dina nʼọnwụ, e lie ya nso nʼebe e liri ha, nʼime obodo Devid. Jotam nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
10 Shalum nwa Jebesh, na ndị ọzọ, gbara izu ọjọọ megide ya, tigbuo ya nʼihu ndị Izrel niile. Ọ ghọkwara eze mgbe Zekaraya nwụrụ. 11 Akụkọ metụtara ihe ndị ọzọ mere mgbe Zekaraya bụ eze, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼụbọchị ndụ ha. 12 Ya mere, okwu ahụ Onyenwe anyị gwara Jehu mezuru, nke bụ: “Ụmụ ụmụ gị ga-anọkwasị nʼocheeze Izrel ruo nʼọgbọ nke anọ ha.”
15 Akụkọ ndị ọzọ gbasara Shalum na izu ọjọọ ya, e deghị ha nʼakwụkwọ ihe mere nʼoge ndị eze Izrel na-achị.
16 Nʼoge ahụ, Menahem sitere na Tịaza buso obodo Tipsa agha, na onye ọbụla bi nʼobodo ahụ na gburugburu ya nʼihi na ha ekweghị emeghe ọnụ ụzọ ama ha. O tigburu Tifsa kwakọrọ ihe niile, bọwakwaa afọ ndị inyom niile dị ime.
19 Mgbe ahụ, Pul[d] eze Asịrịa busoro ala ahụ agha. Menahem nyere ya otu puku talenti ọlaọcha, ime ka Pul kwagide ọchịchị ya, na ime ka aka ya siekwa ike nʼalaeze Izrel. 20 Menahem si nʼaka ndị Izrel nweta ego a. Onye ọgaranya ọbụla tụrụ iri shekel ọlaọcha ise nke e nyere eze Asịrịa. Mgbe eze Asịrịa natachara ọlaọcha ndị a, o si nʼala ahụ pụọ, ọ nọgidekwaghị nʼala ahụ.
21 Akụkọ banyere Menahem na ihe niile o mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼụbọchị ndụ ha? 22 Menahem sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, Pekahaya nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
26 Akụkọ banyere Pekahaya na ihe niile o mere ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼụbọchị ndụ ha.
29 Nʼoge Peka bụ eze Izrel, ka Tiglat-Pilesa, eze Asịrịa bịara were Ijon, Ebel-Bet-Maaka, Janoa, Kedesh, Hazọ, Gilead, Galili na ala ndị Naftalị niile. Ọ chụpụrụ ndị mmadụ niile mee ka ha gaa biri nʼAsịrịa. 30 Nʼoge ahụ, Hoshea nwa Elaa gbara izu ọjọọ megide Peka nwa Remalaya gbuo ya, bụrụ eze nʼọnọdụ ya. Ọ malitere ịbụ eze nʼafọ nke iri abụọ nke ọchịchị eze Jotam nwa Uzaya.
31 Akụkọ banyere Peka na ihe niile o mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel niile mere nʼụbọchị ndụ ha?
36 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile nke oge ọchịchị Jotam na ihe o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda? 37 (Nʼụbọchị ndị ahụ, Onyenwe anyị malitere izite Rezin eze ndị Aram na Peka nwa Remalaya, imegide ndị Juda.) 38 Jotam sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha, nʼobodo Devid, bụ obodo nna ya. Ehaz nwa ya nwoke ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
<- 2 Ndị Eze 142 Ndị Eze 16 ->- a Ọ bụ nʼime senchuri nke asatọ (Tupu a mụọ Kraịst)
- b A kọrọ akụkọ a nʼakwụkwọ 2Ih 26:16-21 ebe ọ pụtara ìhè. Chineke mere ka eze ghọọ onye ekpenta nʼihi nleda anya o ledara ndị nchụaja, mgbe ọ gara chụọ aja, bụ ihe ọ na-ekwesighị ime dịka eze ọ bụ. Ọnụ 3:10; 16:39-40; 18:6-7
- c Ọ bụ Jotam nọ na-achị ala ahụ nʼọnọdụ eze Azaraya ruo mgbe ọ nwụrụ.
- d Pul bụkwa onye a na-akpọ Tiglat-Pilesa, nʼasụsụ ndị Babilọn, gụọ 1Ih 5:26