1 Ya mere, ndị enyi m, ebe anyị nwere nkwa ndị a niile, ka anyị debe onwe anyị ọcha nʼime ihe niile ọbụla nke na-emerụ ahụ anyị na mmụọ anyị. Ka anyị mezuo ịdị nsọ nʼịtụ egwu Chineke.
5 Nʼihi na mgbe anyị batara Masidonia, anyị enweghị izuike ma ọlị. Kama mkpagbu si nʼaka nri na aka ekpe bịakwute anyị, ọgụ nʼezi, egwu nʼime. 6 Ma otu ọ dị, Chineke, onye na-agba ndị ike gwụrụ ume, gbara anyị ume site nʼọbịbịa Taịtọs. 7 Ọ bụkwaghị naanị nʼihi na ọbịbịa ọ bịara nyere anyị obi ụtọ, kama akụkọ o ji bịa, gbasara otu unu si gbaa ya ume, gwakwa anyị otu unu si na-ele anya ịhụ m, na otu unu si na-eru ụjụ nʼihi ihe niile mere, na otu unu si guzosie ike nʼukwu m, na ụdị ịhụnanya unu nwere nʼebe m nọ, obi tọrọ m ụtọ nke ukwuu.
8 Ọ naghị ewutekwa m ugbu a na m deere unu akwụkwọ ahụ, ọ bụ ezie na o wutere m mgbe ahụ m na-ede ya, nʼihi na amaara m na ọ ga-ewetara unu obi ọjọọ mgbe unu gụrụ ya. Ma obi ọjọọ ahụ abụrụla naanị nke nwa oge nta. 9 Ma ugbu a ana m aṅụrị ọṅụ na m dere akwụkwọ ahụ. Ọ bụghị nʼihi na ọgụgụ ya wetaara unu obi ọjọọ, kama ọ bụ nʼihi na mwute o wutere unu emeela ka unu chegharịa. Ụdị mwute unu nwere bụ ụdị mwute Chineke chọrọ ka ndị nke ya nwee. Ya mere, o nweghị ihe ọjọọ bịakwasịrị unu nʼihi akwụkwọ anyị deere unu. 10 Nʼihi na iru ụjụ otu Chineke chọrọ na-eweta nchegharị nke na-eduba mmadụ na nzọpụta, bụ nchegharị nke a na-apụghị ịkwa ụta banyere ya. Ma iru ụjụ dịka ụwa si eme na-eweta ọnwụ. 11 Leenụ ihe Chineke rụpụtara site nʼihe mwute dakwasịrị unu. Ugbu a, unu abụrụla ndị ọ na-anụ ọkụ nʼobi na ndị jikeere izi anyị na aka unu abụọ dị ọcha. Lee otu unu si zi iwe unu, otu unu si zikwa na ihe ahụ wutere unu. Lee otu unu si tụọ ụjọ ihe mmehie ahụ nwere ike iwetara unu. Leekwanụ otu unu si mee ihe niile igosi na unu kwagidere m. Leekwanụ otu unu si nye onye ahụ mere mmehie ahụ ntaramahụhụ ngwangwa. Unu egosila na aka unu dị ọcha nʼokwu ndị a niile. 12 Ọ bụ ezie na m deere unu akwụkwọ ahụ, ma edeghị m ya nʼihi onye ahụ mehiere, maọbụ nʼihi onye ahụ e mehiere megide. Kama edere m ya ime ka Chineke gosi unu otu ihe gbasara anyị si na-anụ unu ọkụ nʼobi. 13 Nʼụzọ niile ndị a, anyị bụ ndị a gbara ume site nʼịhụnanya unu nwere nʼebe anyị nọ.