5 Nʼihi ya, Onyenwe anyị Chineke ya nyefere ya nʼaka eze ndị Aram. Ndị Aram lụgburu ya, kpọrọ ọtụtụ nʼetiti ndị ya dịka ndị mkpọrọ kpọta ha nʼDamaskọs.
9 Ma Oded, onye amụma Onyenwe anyị, nọ na Sameria nʼoge a. Ọ pụrụ jekwuru ndị agha ahụ na Sameria sị ha, “Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha mere ka unu merie ndị Juda nʼihi na ha na-efe arụsị. Ma unu ji ọnụma gbuo ha, nke mere na ụzụ tụrụ ruo nʼeluigwe. 10 Ugbu a, unu na-achọkwa ime ndị ikom na ndị inyom Juda na Jerusalem ndị ohu unu? Ma unu abụghị ndị ikpe mmehie mara nʼebe Onyenwe anyị Chineke unu nọ? 11 Ugbu a, geenụ ntị nʼihe m na-ekwu. Kpọghachinụ ụmụnna unu ndị a unu dọtara nʼagha nʼụlọ ha, nʼihi na ugbu a Onyenwe anyị na-ewe oke iwe megide unu.”
12 Ụfọdụ ndịisi ndị Ifrem, bụ Azaraya nwa Jehohanan, na Berekaya nwa Meshilemot, na Jehizkaya nwa Shalum, na Amasa nwa Hadlai, biliri guzogide ndị ahụ si agha na-alọta. 13 Ha sịrị, “Unu akpọbatakwala ndị a unu dọtara nʼagha nʼebe a, nʼihi na unu mee ya, anyị ga-abụ ndị ikpe maara nʼihu Onyenwe anyị. Unu chọrọ ịtụkwasị ihe na mmehie na ikpe ọmụma anyị? Nʼihi na ikpe ọmụma anyị adịla ukwuu, iwe ya dị ọkụ na-adịkwasịkwa nʼahụ Izrel.”
14 Ya mere, ndị agha ahụ hapụrụ ndị mkpọrọ ahụ na ihe niile ha bulatara, nʼihu ndị ozi na igwe mmadụ ahụ niile. 15 Mgbe ahụ, ndị ikom ahụ akpọrọ nʼaha nʼaha duuru ndị mkpọrọ ahụ, manye aka nʼihe ahụ niile a dọtara nʼagha wepụta uwe, na nri, na mmanya na akpụkpọụkwụ, na mmanụ, nyeghachi ha ndị ahụ niile a dọtara nʼagha. Ha bulitere ndị ọrịa nọ nʼetiti ndị ahụ a dọtara nʼagha kukwasị ha nʼelu ịnyịnya ibu. Emesịa, ha duuru mmadụ ahụ niile dughachiri ha ndị ha nọ na Jeriko, obodo nkwụ. Emesịakwa, ha laghachikwara azụ na Sameria.
16 Nʼoge ahụ, eze Ehaz zigara ndị eze Asịrịa ozi ka ọ bịa nyere ya aka. 17 Ndị Edọm bịara ọzọ buso Juda agha, ma dọrọkwa ọtụtụ nʼime ha nʼagha. 18 Ndị Filistia na-ebusokwa ụfọdụ obodo Juda dị na mgbada ugwu, na Negeb agha. Ha meriri ma bichikwaa obodo ndị a; Bet-Shemesh, na Aijalon, na Gederọt, na Soko, na Timna, na Gimzo, na obodo nta niile gbara ha gburugburu. 19 Ma Onyenwe anyị wedara Juda nʼala nʼihi Ehaz, eze Izrel onye mere ka ihe ọjọọ baa ụba na Juda, na-ekwesighị ntụkwasị obi ya nye Onyenwe anyị. 20 Mgbe Tiglat-Pilesa[a] eze ndị Asịrịa bịara, o wetaara Ehaz nsogbu kama enyemaka. 21 Ehaz weere ụfọdụ ihe dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, na nke dị nʼụlọeze, sitekwa na nʼụlọ ndịisi obodo, were ha nye eze Asịrịa, ma ihe ndị a enyereghị ya aka.
22 Nʼoge nsogbu ya, eze Ehaz gakwara nʼihu bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị. 23 Ọ chụrụ aja nye chi niile nke Damaskọs, bụ ndị meriri ya nʼagha. Ọ sịrị, “Nʼihi na chi nke ndị eze Aram nyeere ha aka, ha ka m ga-achụrụ aja, ka ha nwee ike nyere m aka.” Ma ha bụ ihe wetaara ya ọdịda, bụrụkwa ọdịda nye Izrel niile.
24 Ehaz chịkọtara ngwongwo niile dị nʼụlọnsọ ukwu Chineke, gbujasịa ha. O mechiri ọnụ ụzọ niile e si abanye nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ma wuo ọtụtụ ebe ịchụ aja na nkuku ụzọ niile nʼime Jerusalem. 25 Nʼobodo niile ọbụla na Juda, o wuru ebe dị elu maka ịchụ aja dị iche iche nye chi ndị ọzọ, si otu a kpasuo Onyenwe anyị, bụ Chineke nna nna ya ha iwe.
26 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị ya, site na mmalite ruo ọgwụgwụ, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda na Izrel? 27 Ehaz soro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼobodo Jerusalem, ma ọ bụghị nʼime ili ebe a na-eli ndị eze Izrel. Hezekaya nwa ya, ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
<- 2 Ihe E Mere 272 Ihe E Mere 29 ->- a Nke a bụ otu ọzọ e si akpọ Tiglat-Pilnesa