1 Mgbe ahụ, Jehoshafat sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha nʼobodo Devid. Jehoram nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 2 Ụmụnne Jehoram, ndị bụkwa ụmụ Jehoshafat bụ ndị a: Azaraya, Jehiel, Zekaraya, Azarayu, Maikel na Shefataya. Ndị a niile bụ ụmụ Jehoshafat, bụ eze Izrel. 3 Nna ha nyere onye ọbụla nʼime ha ọtụtụ onyinye nke ọlaọcha, na ọlaedo, na ihe ndị dị oke ọnụahịa, tinyere obodo e wusiri ike nʼime Juda. Ma o mere Jehoram eze, nʼihi na ọ bu ọkpara ya.
8 Nʼoge Jehoram bụ eze, ka Edọm si nʼokpuru Juda nupu isi, họpụtara onwe ha eze. 9 Ya mere, Jehoram duuru ndịisi agha ya na ụgbọ agha ya niile gaa nʼebe ahụ. O biliri nʼabalị tigbuo ndị Edọm ahụ gbara ya na ndị ọchịagha ụgbọ agha ya gburugburu. 10 Ya mere, Edọm ka na-enupu isi megide Juda, ruo taa.
12 Jehoram natara akwụkwọ ozi site nʼaka Ịlaịja onye amụma, nke sịrị:
16 Onyenwe anyị mekwara ka ndị Filistia, na ndị Arab, ndị bi nso ndị Kush, bịa lụso Jehoram agha. 17 Ha ji ike bata Juda, buru ihe niile dị mma ha hụrụ nʼụlọeze, tinyere ụmụ nwoke ya niile na ndị nwunye ya niile. Ọ bụ naanị Ahazaya, nwa ya nwoke nke nta ka ha hapụrụ.
18 Ọ bụ mgbe nke a gasịrị ka Onyenwe anyị mere ka ọrịa afọ nke a na-apụghị ịgwọta agwọta bịakwasị Jehoram. 19 Mgbe afọ abụọ gasịrị, eriri afọ ya nupụtara nʼihi ọrịa ahụ. Ọ nwụkwara nʼoke ihe mgbu. Mgbe e liri ya, e meghị omenaala ịkwanye ọkụ olili dịka a na-eme nʼoge a na-eli ndị eze.
20 Ọ gbara iri afọ atọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze Jerusalem. Ọ chịrị afọ asatọ nwụọ. Ọnwụ ya abụghị ihe mwute nye onye ọbụla. E liri ya nʼobodo Devid ma ọ bụghị nʼime ili a na-eli ndị eze.
<- 2 Ihe E Mere 202 Ihe E Mere 22 ->