1 Nʼafọ nke iri atọ na isii nke ọchịchị Asa, Baasha eze Izrel, busoro Juda agha, wuchie Rema igbochi onye ọbụla na-apụ apụ maọbụ onye na-abata abata nʼoke ala Asa, eze Juda.
2 Mgbe ahụ, Asa chịịrị ọlaọcha na ọlaedo niile dị nʼụlọakụ ụlọnsọ
4 Ben-Hadad kwenyere eze Asa, zipụ ndị ọchịagha ndị agha ya ka ha gaa buso obodo Izrel niile agha. Ha lụgburu Ijon, Dan, Ebel-Maim[a] na obodo niile a na-achịkọbata ihe dị na Naftalị. 5 Mgbe Baasha nụrụ nke a, ọ kwụsịrị iwu Rema, hapụkwa ọrụ ya. 6 Mgbe ahụ, eze Asa chịịrị ndị ikom niile nke Juda. Ha bịara bupusịa nkume na osisi niile dị na Rema, nke Baasha ji na-ewu ihe. O ji ihe ndị a wulie Geba na Mizpa.
7 Nʼoge ahụ Hanani, bụ onye ọhụ ụzọ bịakwutere Asa, bụ eze Juda sị ya, “Ebe ọ bụ na ị hapụrụ
10 Iwe were Asa megide onye ọhụ ụzọ a nʼihi nke a; iwe were ya nke ukwuu nke mere na ọ tụnyere Hanani nʼụlọ mkpọrọ. Sitekwa nʼoge ahụ, Asa bidoro imekpa ụfọdụ nʼime ndị ya ahụ.
11 Ihe banyere ihe ọzọ niile nʼoge ọchịchị Asa, site na mmalite ruo ọgwụgwụ ka e dere nʼime akwụkwọ ndị eze Juda na Izrel. 12 Nʼime iri afọ atọ na itoolu nke ọchịchị ya, eze Asa rịara ọrịa nke metụtara ụkwụ ya abụọ. Ọ bụ ezie na ọrịa a siri nọọ ike ma nʼime ọnọdụ ya ọ chọghị enyemaka site nʼaka
-
a 16:4 Aha ọzọ e ji mara ya bụ Ebel-Bet-Maaka