Link to home pageLanguagesLink to all Bible versions on this site
27
Devid ebiri nʼetiti ndị Filistia
1 Devid chere nʼime onwe ya sị, “Otu ụbọchị Sọl ga-enweta m, bibie m. Ihe ka mma m ga-eme bụ ịgbaga nʼala ndị Filistia. Nke a ga-eme ka Sọl kwụsị ịchọgharị m ebe ọbụla nʼIzrel. Aga m esikwa otu a, nwere onwe m site nʼaka ya.”

2 Ya mere, Devid na narị ndị ikom isii ya, na ezinaụlọ ha, biliri jekwuru Akish nwa Maok, eze ndị Gat. 3 Devid na ndị agha ya sooro Akish biri na Gat. Onye ọbụla du ezinaụlọ ya. Devid nʼonwe ya du ndị inyom abụọ ya: Ahinoam onye Jezril, na Abigel onye Kamel, nwunye ochie Nebal. 4 Ọ dịghị anya, Sọl nụrụ na Devid agbalaala Gat, nʼihi ya ọ kwụsịrị ịchụso ya.

5 Devid gwara Akish sị ya, “Ọ bụrụ na m anatala amara nʼebe ị nọ, ọ ga-adị mma ka enye m otu obodo nʼime obodo nke ala a, ka m biri. Nʼihi gịnị ka ohu gị ga-eji soro gị biri nʼobodo eze?”

6 Akish nyere ya Ziklag, nʼihi ya, Ziklag bụ obodo ndị eze Juda ruo taa. 7 Devid biri nʼoke ala ndị Filistia otu afọ na ọnwa anọ.

8 Devid na ndị ikom ya nọgidere oge ahụ niile na-emegide ndị Geshua, ndị Gizi na ndị Amalek. (Site na mgbe ochie ndị a bi nʼala ahụ gbatịrị ruo Shua na Ijipt) 9 Mgbe ọbụla Devid wakporo akụkụ ọbụla, ọ dịghị ahapụ nwoke maọbụ nwanyị ndụ. Ma ọ na-akpụrụ atụrụ ha, na ehi ha, na ịnyịnya ibu ha, na ịnyịnya kamel ha, nakwa uwe ha. Emesịa, ọ na-alọghachikwuru Akish.

10 Ọ bụrụ na Akish ajụọ Devid ajụjụ sị, “Ndị ole ka unu busoro agha taa?” Devid ga-aza sị, “Ọ bụ ndị bi na ndịda Juda”, maọbụ “ndị ndịda Jerahmel”, maọbụ “ndị ndịda Ken.”*Ndị Jerahmel bụ ụmụ ụmụ Juda site na nwa nwa ya bụ Hezrọn, 1Ih 2:5,9,25 gụọ ihe banyere ndị Ken nʼihe e depụtara nʼakwụkwọ. Nkp 4:11 11 Ma ọ dịghị nwoke maọbụ nwanyị onye ọ hapụrụ ndụ, nke a ga-akpọta na Gat, nʼihi na o chere nʼobi ya sị, “Ha nwere ike ịbịa kwuo megide anyị, sị, ‘Otu a ka Devid mere.’ ” Otu a ka ọ na-emekwa ọtụtụ oge ahụ niile o bi nʼetiti ndị Filistia. 12 Akish kwenyere Devid, kwuo nʼobi ya sị, “Devid abụrụla ihe a kpọrọ asị nʼebe ndị nke ya bụ ndị Izrel nọ. Ọ ga-abụkwara m ohu ruo mgbe niile.”

<- 1 Samuel 261 Samuel 28 ->