4 Eze gara Gibiọn nʼihi ịchụ aja, nʼihi na ebe ahụ bụ ebe kachasị mkpa, dị elu. Solomọn chụrụ otu puku aja nsure ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ. 5 Na Gibiọn, Onyenwe anyị mere ka Solomọn hụ ya anya na nrọ nke abalị, Chineke sịrị ya, “Rịọọ ihe ọbụla ị chọrọ ka m nye gị.”
6 Solomọn zara sị, “I gosila ohu gị bụ nna m Devid obi ebere dị ukwuu, nʼihi na ọ bụ onye kwesiri ntụkwasị obi nye gị, onye ezi omume nakwa onye obi ya ziri ezi. Ị nọgidela na-egosi ya obi ebere dị ukwuu, nyekwa ya nwa nwoke ga-anọkwasị nʼocheeze ya nʼụbọchị taa.
7 “Ugbu a, Onyenwe anyị bụ Chineke m, i meela ohu gị eze nʼọnọdụ nna m, bụ Devid. Ma abụ m naanị nwantakịrị[a] na-amaghị otu esi apụ ma na-abatakwa.[b] 8 Ohu gị nọ nʼebe a, nʼetiti ndị gị ị họpụtara, ndị bara ụba nke ukwuu, ndị a na-adịghị agụta ọnụ nʼihi nʼọnụọgụgụ ha babigara ụba oke. 9 Ya mere, nye ohu gị uche nghọta nke m ga-eji chịa ndị gị, na ịghọta ihe dị iche nʼetiti ezi ihe na ajọ ihe. Nʼihi na onye pụrụ ịchịkọta ndị gị a dị ukwuu?”
10 Ọ masịrị Onyenwe anyị na Solomọn rịọrọ nke a. 11 Ya mere, Chineke zara sị ya, “Nʼihi na ị rịọrọ amamihe na nghọta ị ga-eji chịa ndị m, ma ị rịọghị m ka m nye gị ndụ ogologo, maọbụ akụnụba, maọbụ ọnwụ nye ndị iro gị. 12 Aga m eme dịka ihe ị rịọrọ si dị. Aga m enye gị obi maara ihe na uche ịghọta ihe ziri ezi, nke ga-abụ na ọ dịghị onye ọbụla dịka gị, ọ dịghịkwa onye ọbụla ga-adị ka gị. 13 Ọzọkwa, aga m enyekwa gị ihe ndị ahụ ị na-arịọghị m, akụnụba, na nsọpụrụ, ka ọ ga-abụ nʼụbọchị niile nke ndụ gị, ị gaghị enwe onye ọbụla ga-adị ka gị nʼetiti ndị eze niile. 14 Ọ bụrụkwa na i jee ije nʼụzọ m niile, debe iwu m, meekwa ihe m gwara gị, dịka nna gị Devid mere, aga m enye gị ogologo ndụ.” 15 Mgbe ahụ, Solomọn si nʼụra teta, ghọtakwa na ọ bụ nrọ ka ọ na-arọ.
19 “Ma nʼotu abalị, nwa ya nwụrụ mgbe o dinakwasịrị ya nʼoge ọ na-arahụ ụra. 20 Mgbe o biliri nʼetiti abalị, chọpụtara na nwa ya anwụọla, o kuuru ya nibe ya nʼakụkụ m, kurukwanụ nwa nke m dị ndụ nibe nʼakụkụ ya onwe ya. 21 Nʼisi ụtụtụ, mgbe m tetara nʼụra chọọ inye nwa m ara, achọpụtara m na ọ nwụọla. Ma mgbe m leziri ya anya nke ọma ka chi bọrọ, ahụrụ m na nwa mụ na ya dina abụghị nwa nke m mụrụ.”
22 Mgbe ahụ, nwanyị nke ọzọ kwuru sị, “Mba, nwantakịrị ahụ dị ndụ bụ nwa m, ma nke nwụrụ anwụ bụ nwa gị.” Nwanyị nke mbụ zara sị,
23 Eze kwuru sị, “Onye nke a na-asị, ‘Nwa m bụ nke dị ndụ, ma nke gị bụ nke nwụrụ anwụ,’ mgbe onye nke ọzọ na-asị, ‘Mba! Nwa gị bụ nke nwụrụ anwụ, ma nke m bụ nke dị ndụ.’ ”
24 Mgbe ahụ, eze sịrị, “Wetara m mma agha.” Ya mere, ha wetaara eze mma agha. 25 Eze nyere iwu sị, “Kpọwaa nwa ahụ dị ndụ ụzọ abụọ, were otu ọkara nye otu onye, werekwa nke ọzọ nye onye nke ọzọ.”
26 Nwanyị ahụ nwa ya dị ndụ jupụtara nʼọmịiko nʼebe nwa ya nọ, ọ gwara eze sị, “Biko, onyenwe m, kunye ya nwantakịrị ahụ dị ndụ. Egbukwala ya.”
27 Mgbe ahụ, eze kpebiri ikpe sị, “Kuru nwantakịrị a dị ndụ kunye ya nwanyị ahụ chọrọ ka ọ dị ndụ. Egbula ya, nʼihi na nwanyị ahụ bụ nne ya.”
28 Mgbe ndị Izrel niile nụrụ otu eze si kpebie ikpe a, ha sitere nʼịtụ egwu nye eze nsọpụrụ, nʼihi na ha hụrụ na o si nʼaka Chineke nweta amamihe[d] ikpe ikpe ziri ezi.
<- 1 Ndị Eze 21 Ndị Eze 4 ->