6 Ọ bụ onye ahụ bịara site na mmiri na ọbara, ya bụ Jisọs Kraịst. O siteghị naanị na mmiri bịa, kama o sitere na mmiri na ọbara. Ọ bụkwa Mmụọ Nsọ na-agba ama maka ya, nʼihi na Mmụọ Nsọ bụ eziokwu. 7 Nʼihi na ha dị atọ gbara akaebe: 8 Mmụọ Nsọ,[a] na mmiri na ọbara, ha atọ kwekọrịtara. 9 Ọ bụrụ na anyị nabata akaebe nke mmadụ gbara, akaebe nke Chineke gbara dị ukwuu karịa, nʼihi na ọ bụ akaebe Chineke gbara banyere Ọkpara ya. 10 Onye ọbụla kweere nʼỌkpara Chineke nwere ọgbụgba ama a nʼobi ya. Ma onye ọbụla na-ekwereghị na Chineke emeela ya ka ọ bụrụ onye ụgha, nʼihi na o kwereghị nʼama ahụ Chineke gbara banyere Ọkpara ya. 11 Ama ahụ bụkwa nke a, na Chineke enyela anyị ndụ ebighị ebi, ndụ a dịkwa nʼime Ọkpara ya. 12 Onye ọbụla nwere Ọkpara ahụ nwere ndụ ma onye ọbụla na-enweghị Ọkpara Chineke enweghị ndụ.
16 Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụ ka nwanna ya na-eme mmehie nke na-adịghị eduba nʼọnwụ, ya kpee ekpere, Chineke ga-enyekwa onye ahụ ndụ. Nke a bụ maka ndị ahụ mmehie ha na-abụghị nke na-eduba nʼọnwụ. E nwere mmehie na-eduba nʼọnwụ. Asịghị m unu kpee ekpere maka nke ahụ. 17 Ajọ omume niile bụ mmehie, ma ọ dị mmehie nke na-adịghị eduba nʼọnwụ.
18 Anyị matara na onye ọbụla amụrụ site na Chineke anaghị aga nʼihu na-eme mmehie, kama onye ahụ nke amụrụ site na Chineke na-echekwa ha, ajọ onye ahụ adịghị emetụkwa ha aka. 19 Anyị maara na anyị bụ ụmụ Chineke, ụwa niile nọkwa nʼokpuru ike ajọ onye ahụ. 20 Anyị matakwara na Ọkpara Chineke abịala, nyekwa anyị nghọta ka anyị mara ya, onye bụ eziokwu. Anyị nọ nʼime onye ahụ bụ eziokwu, ọ bụladị nʼime Ọkpara ya, bụ Jisọs Kraịst. Ya onwe ya bụ ezi Chineke bụrụkwa ndụ ebighị ebi.
- a Nʼakwụkwọ ndị ọhụrụ nke Vụlget na-agba akaebe nʼeluigwe: Nna, Okwu ahụ na Mmụọ Nsọ, ha atọ bụ otu. 8 Ha dịkwa atọ na-agba akaebe nʼụwa: (nke a adịghị nʼakwụkwọ Griik ọbụla tupu senchuri nke iri na anọ)