3 Devid lụrụ ndị inyom ọzọ mgbe o jere biri na Jerusalem. Nke a mere ka ọ mụọ ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị. 4 Ndị a bụkwa aha ụmụ a mụụrụ ya nʼebe ahụ: Shamua, Shobab, Netan, Solomọn, 5 Ibha, Elishua, Elpelet, 6 Noga, Nefeg, Jafia, 7 Elishama, Beeliada na Elifelet.
11 Ya mere, Devid na ndị ikom ya gara Baal-Perazim, meriekwa ha nʼebe ahụ. O kwuru sị, “Chineke enupula megide ndị iro m site nʼaka m, dịka idee mmiri si enupu.” Nʼihi ya, a kpọrọ ebe ahụ Baal Perazim. 12 Ndị Filistia hapụrụ chi niile ha nʼebe ahụ, Devid nyere iwu ka e suo ha niile ọkụ.
13 Ndị Filistia bukwara agha bịa na ndagwurugwu ahụ ọzọ. 14 Nʼihi nke a, Devid jụrụ Chineke ase ọzọ. Chineke sịrị ya, “Esitekwala nʼihu buso ha agha, kama gbaa ha gburugburu, buso ha agha na ncherita ihu osisi balsam ndị ahụ. 15 Ngwangwa ị nụrụ ụda ikiri ụkwụ nʼelu osisi balsam ndị ahụ, mgbe ahụ ka unu ga-apụ ibu agha, nʼihi na nke a pụtara na Chineke eburula unu ụzọ pụọ, itigbu ndị agha Filistia.” 16 Devid mere dịka Chineke nyere ya nʼiwu. Ha tigburu ndị agha Filistia site na Gibiọn ruo Gaza.
17 Ya mere, aha Devid bidoro na-ewu ewu; Onyenwe anyị tinyekwara ụjọ ya nʼobi mba niile.
<- 1 Ihe E Mere 131 Ihe E Mere 15 ->